ABÙ ỌMA 118 - Bible Lgbo

1Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:

N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2Biko, ka Israel si,

Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

3Biko, ka ulo Eron si,

Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si,

Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

5M'siri na nkpàm kpọkue Ja;

Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.

6Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu:

Gini ka madu gēmem?

7Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka:

Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.

8Ọ di nma ib͕abà nime Jehova

Kari itukwasi madu obi.

9Ọ di nma ib͕abà nime Jehova

Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.

10Mba nile ab͕awom buruburu:

N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

11Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu:

N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

12Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu:

N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

13I nudawom enuda ka m'we da:

Ma Jehova yerem aka.

14Ikem na abù ọmam ka Ja bu:

Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.

15Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume:

Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

16Ebuliwo aka-nri Jehova elu:

Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

17M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu,

M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.

18Ja adọwom aka na nti nke-uku:

Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.

19Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume:

M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.

20Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere;

Ndi ezi omume gābà nime ya.

21M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom,

I we ghọrọm nzọputa.

22Nkume nke ndi nēwu ulo juru

Aghọwo isi nkuku ulo.

23Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere;

Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.

24Nka bu ubọchi Jehova meworo;

Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.

25Biko, Jehova, zọputa, biko:

Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.

26Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova:

Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.

27Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè:

Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.

28Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi:

Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu.

29Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:

N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help