NDI-HIBRU 8 - Bible Lgbo

1Ma isi ihe n'ihe nile ayi nēkwu bu nka: Ayi nwere onye-isi-nchu-àjà di otú a, Onye nọduru ala n'aka-nri nke oche-eze nke Idi-uku ahu di nime elu-igwe,

2Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu.

3N'ihi na anēdo onye-isi-nchu-àjà ọ bula iche onyinye na àjà di iche iche n'iru Chineke: o sitere na nka di nkpà ka Onye-isi-nchu-àjà nka nwe kwa ihe iche n'iru Chineke.

4Ya mere ọ buru na Ọ nọ n'uwa, Ọ gaghi-abu onye-nchu-àjà ma-ọli, ebe ndi nēche onyinye ahu nile n'iru Chineke dika iwu si di nọ:

5ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu.

6Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma.

7N'ihi na asi na ọb͕ub͕a-ndu mbu ahu adighi ita uta, agaghi-achọwori ebe nye ọb͕ub͕a-ndu nke-abua.

8N'ihi na mb͕e Ọ nāta ha uta, Ọ si,

Le, ubọchi nābia, ka Onye-nwe-ayi kwuru,

Mb͕e Mu na ulo Israel na ulo Juda gāb͕a ọb͕ub͕a-ndu ọhu;

9Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara

N'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha;

N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum,

Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,

10N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a

Mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;

M'gētiye iwum n'uche-ha,

Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ:

M'gābu-kwa-ra ha Chineke,

Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:

11Ha agaghi-izírita onwe-ha ma-ọli, onye ọ bula ọ nēzí onye obodo-ya,

Onye ọ bula ọ nēzí kwa nwa-nne-ya, si, Mara Onye-nwe-ayi:

N'ihi na ha nile gāmatam,

Site n'onye dikarisiri ntà rue onye dikarisiri uku nime ha.

12N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere,

M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.

13Mb͕e Ọ nāsi, Ọb͕ub͕a-ndu ọhu, O mewo nke-mbu ka ọ buru ihe ochie. Ma ihe nēme ochie, nke nāka kwa nká, ga-apu-n'anya nso.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help