ZEKARAIA 3 - Bible Lgbo

1Ọ we me ka m'hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n'iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n'aka-nri-ya imegide ya.

2Jehova we si Setan, Jehova basiere gi nba ike, Setan; e, Jehova Nke rọputaworo Jerusalem basiere gi nba ike: onye a, ọ̀ bughi ọlọkọ-ọku alọputara n'ọku?

3Ma Joshua nēyi uwe rusiri inyi, guzo n'iru mọ-ozi ahu.

4O we za, gwa ndi nēguzo n'iru ya okwu, si, Chizuga uwe rusiri inyi n'aru ya. O we si ya, Le, emewom ka ajọ omume-gi si n'aru gi gabiga, M'gēyibe kwa gi uwe ememe.

5M'we si, Ka ha kukùa ákwà-nkukù-isi nwuru enwu n'isi-ya. Ha we kee akwa nkechi-isi nwuru enwu n'isi-ya, yibe ya uwe; mọ-ozi Jehova nēguzo kwa n'ebe ahu.

6Mọ-ozi nke Jehova we b͕ara Joshua àmà nke-uku, si,

7Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ buru na i je ije n'uzọm nile, ọ buru kwa na i debe ihe-ndebem, ọ gābu kwa na gi onwe-gi gēkpe ulom ikpe, ọzọ, i gēdebe kwa ogigem nile, M'gēnye kwa gi ebe-njeghari di iche iche n'etiti ndia nēguzo n'ebe a.

8Biko, nuru, gi Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, gi onwe-gi na ndi-ibe-gi ndi nānọdu ala n'iru gi; n'ihi na ndi bu ihe-ebube ka ha bu: n'ihi na, le, M'gaje ime ka orùm, bú Ihe-opupú ahu, puta ìhè.

9N'ihi na, le, nkume ahu nke M'tiyeworo n'iru Joshua; n'elu otù nkume ka anya asa di: le, M'gēb͕u eb͕ub͕u-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gēbupu kwa ajọ omume ala ahu n'otù ubọchi.

10N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ka unu gākpọbata, onye ọ bula ọ kpọbata madu-ibe-ya, n'okpuru osisi vine na n'okpuru osisi fig.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help