I. IHE EMERE 3 - Bible Lgbo

1Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel;

2nke-atọ, Absalom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ, Adonaija nwa Hagit;

3nke-ise, Shefataia nwa Abital; nke-isi, Itream nwa Egla, bú nwunye-ya.

4Umu isi ka amuru nye ya nime Hebron; o we buru eze n'ebe ahu arọ asa na ọnwa isi: orú arọ na iri na atọ ka ọ bu eze na Jerusalem.

5Ma ndia ka amuru nye ya nime Jerusalem: Shimea, na Shobab, na Netan, na Solomon, anọ, bú nke Bat-shua nwa-nwayi Amiel:

6na Ibha, na Elishama, na Elifelet;

7na Noga, na Nefeg, na Jafia;

8na Elishama, na Eliada, na Elifelet, iteghete.

9Ndia nile bu umu-ndikom Devid, nāgughi umu-ndikom ndi-iko-ya ndinyom; Tema bu nwa-nne-ha nwayi.

10Nwa Solomon bu Rehoboam, Abaija nwa-ya, Esa nwa-ya, Jehoshafat nwa-ya;

11Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya;

12Amazaia nwa-ya, Azaraia nwa-ya, Jotam nwa-ya;

13Ehaz nwa-ya, Hezekaia nwa-ya, Manase nwa-ya;

14Emon nwa-ya, Josaia nwa-ya.

15Umu-ndikom Josaia kwa; ọkpara-ya Johanan, nke-abua Jehoiakim, nke-atọ Zedekaia, nke-anọ Shalum.

16Umu-ndikom Jehoiakim kwa: Jekonaia nwa-ya, Zedekaia nwa-ya.

17Umu-ndikom Jekonaia kwa, bú onye-nkpọrọ: Shealtiel nwa-ya,

18na Malkiram, na Pedaia, na Shenaza, na Jekamaia, na Hoshama, na Nedabaia.

19Umu-ndikom Pedaia kwa; Zerubabel, na Shimai: umu-ndikom Zerubabel kwa; Meshulam, na Hananaia; Shelomit bu nwa-nne-ha nwayi:

20na Hashuba, na Ohel, na Berekaia, na Hasadaia, na Jushab-hesed, ise.

21Umu-ndikom Hananaia kwa; Pelataia, na Jeshaia: umu-ndikom Refaia, umu-ndikom Anan, umu-ndikom Obadaia, umu-ndikom Shekanaia.

22Umu-ndikom Shekanaia kwa; Shemaia: umu-ndikom Shemaia kwa: Hatush, na Igal, na Baria, na Nearaia, na Shefat, isi.

23Umu-ndikom Nearaia kwa; Elioenai, na Hizkia, na Azrikam, atọ.

24Umu-ndikom Elioenai kwa; Hodavaia, na Elaiashib, na Pelaia, na Akub, na Johanan, na Delaia, na Anani, asa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help