ABÙ ỌMA 84 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Aba: n'elu Gittith. Abù Ọma umu Kora.

1Le ka ebe-obibi-Gi nile si buru eba ahuru n'anya nke-uku,

Jehova nke usu nile nke ndi-agha!

2Agu agusiwo nkpuru-obim ike, e, ọ gwusiwo kwa n'ichọ ogige nile nke Jehova;

Obim na anu-arum nētiku Chineke di ndu nkpu ọṅù.

3Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo,

Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-ya

Bú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha,

Ezem na Chinekem.

4Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi bi n'ulo-Gi bu:

Ha gānọ nēto Gi. Selah

5Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke ike o nwere di na Gi;

Uzọ nile atuliri atuli ijeru Zaion di ha n'obi.

6Mb͕e ha nāgabiga ndagwurugwu Baka ha nēme ya ka ọ buru ebe isi-iyi di iche iche;

Ọzọ, miri-ozuzo mbu nēwere ngọzi nile kpuchie ya.

7Ha nēsi n'ike jerue ike,

Anēme ka Chineke hu onye ọ bula nime ha nime Zaion.

8Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nu ekperem:

Ṅa nti, Gi Chineke nke Jekob. Selah

9Le ọta-ayi, Chineke,

Legide kwa iru onye-Gi etere manu.

10N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ.

Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem,

Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.

11N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu:

Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye:

Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ.

12Jehova nke usu nile nke ndi-agha,

Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help