JOB 41 - Bible Lgbo

1Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi?

Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?

2Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya?

Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?

3Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara?

Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?

4Ò gēso gi b͕a ndu?

Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?

5Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu?

Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?

6Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia?

Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia?

7Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya?

Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?

8Tukwasi ya ọbu-aka-gi;

Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.

9Le, nchere-ya bu ihe-ugha:

Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya?

10Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya:

Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum?

11Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi?

Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.

12M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru,

Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya.

13Ònye kpugheworo iru uwe-ya?

Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?

14Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?

Ezé-ya di oké ujọ buruburu.

15Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,

Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.

16Dika otù si nọ ibe-ya nso,

Ifufe adighi-abà n'etiti ha.

17Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya;

Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.

18Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,

Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.

19N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,

Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.

20N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,

Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.

21Iku-ume-ya nāmunye icheku,

Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.

22N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,

Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.

23Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha:

O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.

24Obi-ya siri ike dika nkume;

O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.

25Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:

Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.

26Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;

Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.

27Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka,

Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.

28Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:

Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.

29Anāgu ndele n'ahihia-ọka:

Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.

30Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:

Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.

31Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:

Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.

32Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;

Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.

33Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa,

Nke emeworo nēnweghi ujọ.

34Ihe nile nke di elu ka ọ nāhu:

Ya onwe-ya bu eze anu-ọhia nile di nganga.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help