EMOS 6 - Bible Lgbo

1Ahuhu diri ndi nọ jū na Zaion, na ndi nwere ntukwasi-obi n'ugwu Sameria, ndi akpọrọ n'aha n'aha n'etiti isi mba nke mba nile, ndi ulo Israel biakuteworo!

2Gabiganu rue Kalne, hu; si-kwa-nu n'ebe ahu jerue Hemat nke bara uba: rida-kwa-nu rue Gat nke ndi Filistia: hà di nma kari ala-eze ndia? ma-ọbu ókè-ala-ha, ò riri nne kari ókè-ala-unu?

3Unu ndi nāchupu ubọchi ọjọ, ma unu nēme ka ọnọdu ihe-ike bia nso:

4ndi nēdina n'elu ihe-ndina ọdú, nēseti kwa onwe-ha n'elu ebe-ndina-ha, nēri kwa umu-aturu ọma sitere n'ìgwè ewu na aturu, na umu-ehi site n'etiti ulo ebe anēme ka anu ma abuba;

5ndi nābùso olu une abù efu; dika Devid ka ha zuputaworo onwe-ha ubọ-abù di iche iche;

6ndi nāṅu manya-vine n'ọkwa-nwusa, ọ bu kwa manu kachasi nma ka ha ji ete onwe-ha; ma ha ariaghi ọria n'ihi nkpaji akpajiri Josef.

7N'ihi nka ub͕u a ka agēme ka ha je biri n'ala ọzọ buru ndi-obu-uzọ nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, oriri ọkwukwa-ozu nke ndi nēseti onwe-ha gēwezuga kwa onwe-ya.

8Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M'kpọworo asì: M'gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n'aka onye-iro.

9Ọ gēru kwa, na ọ buru na ndikom iri fọduru n'otù ulo, na ha gānwu.

10Ma mb͕e nwa-nne nna madu, bú onye-nsure-ọku-ya, gēburu ya ichipu ọkpukpu n'ulo, si onye nke nọ n'ime-ime-ulo nke ulo ahu, Ọ̀ di onye ọzọ gi na ya nọ? ọ gāsi, É-è; si kwa, Nọdu du; n'ihi na ayi agaghi-ehota aha Jehova.

11N'ihi na, le, Jehova nēnye iwu, Ọ gētipiasi kwa ulo uku, ọ bu kwa ulo ntà ka Ọ gētiwasi.

12Inyinya, hà nāb͕a ọsọ n'elu nkume di elu? àgēji ehi dọ ihe eji gwu ala-ubi n'ebe ahu? na unu ab͕anwewo ikpé ka ọ ghọ ńsí, b͕anwe kwa nkpuru ezi omume ka ọ ghọ wormwood:

13unu ndi nāṅuri n'ihe nābughi ihe, ndi nāsi, Ọ̀ bughi ike nke aka ayi ka ayi jiworo natara onwe-ayi mpi di iche iche?

14N'ihi na, le, M'gaje ime ka otù mba bilie imegide unu, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta; ha gēmeb͕u kwa unu site na nbata Hemat rue iyi Araba.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help