LEVITIKỌS 8 - Bible Lgbo

1Jehova we gwa Moses okwu, si,

2Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko;

3kpọkọta kwa nzukọ Israel nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

4Moses we me dika Jehova nyere ya iwu; ewe kpọkọta nzukọ ahu n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

5Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka eme ya.

6Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru.

7O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya.

8Ọ tukwasi n'aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu.

9Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

10Moses we were manu otite-manu ahu, te ebe-obibi ahu na ihe nile nke di nime ya, do ha nsọ.

11Ọ we fesa ufọdu nime ya n'ebe-ichu-àjà ub͕ò asa, te kwa ebe-ichu-àjà na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri na ukwu-ala-ya, manu, ido ya nsọ.

12Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n'isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ.

13Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu.

14Ọ kputa oke-ehi nke àjà-nmehie nso: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'oke-ehi nke àjà-nmehie.

15O b͕ue ya; Moses we were ọbara-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu buruburu na nkpisi-aka-ya, wepu nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu: ọbara ahu ka ọ wusi-kwa-ra na ntọ-ala ebe-ichu-àjà, do ya nsọ, ikpuchiri ya nmehie.

16Ọ were abuba nile nke di n'elu ihe-ime, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ abua, na abuba-ha, Moses we sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà.

17Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu.

18Ọ weta nso ebulu nke àjà-nsure-ọku: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.

19O b͕ue ya: Moses we wusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.

20Ọ bọ ebulu ahu n'ọbubọ-ya; Moses we sure isi-ya na ọbubọ-ya nile na abuba-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

21Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu.

22Ọ we weta nso ebulu nke-ọzọ, bú ebulu nke nmeju-aka: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.

23O b͕ue ya; Moses we were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'isi-aka nke aka-nri-ya, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ya.

24Ọ me ka umu-ndikom Eron biaru nso, Moses we were ufọdu nime ọbara ahu, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri ha, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha: Moses we wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu.

25Ọ were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba-ha, na utaku-ukwu aka-nri ya:

26o si na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova were otù ob͕e achicha ekoghi-eko, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, tukwasi ha n'abuba ahu na n'utaku-ukwu aka-nri:

27o tiye ha nile n'elu ọbu-aka abua nke Eron, na n'elu ọbu-aka nke umu-ya ndikom, we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova.

28Moses we wepu ha n'elu ọbu-aka-ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu: nmeju-aka ka ha bu, ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.

29Moses were kwa okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: òkè Moses nwere ka ọ bu sitere n'ebulu nmeju-aka; dika Jehova nyere Moses iwu.

30Moses were kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu, na ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya; ọ we do Eron nsọ, do kwa uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom, nsọ tiyere ya.

31Moses we si Eron na umu-ya ndikom, Sienu anu-ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēri ya na achicha nke di na nkata nke nmeju-aka ahu, dika m'nyere n'iwu, si, Eron na umu-ya ndikom gēri ya.

32Ma ihe nke fọduru nime anu ahu na nime achicha ahu, n'ọku ka unu gēsure ya.

33Unu esi-kwa-la n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute pua ubọchi asa, rue ubọchi mb͕e ubọchi nile nke nmeju-aka-unu gēzu: n'ihi na ubọchi asa ka Ọ ganēmeju aka-unu.

34Dika emere ta, otú a ka Jehova nyere iwu ime, ikpuchiri unu nmehie-unu.

35Ọ bu kwa n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ka unu gānọgide ehihie na abali ubọchi asa, debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, ka unu we ghara inwu: n'ihi na otú a ka enyeworom iwu.

36Eron na umu-ya ndikom we me ihe nile Jehova nyere n'iwu site n'aka Moses.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help