EZIKIEL 43 - Bible Lgbo

1O we me ka m'jerue ọnu-uzọ-ama ahu, bú ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu:

2ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya.

3Ọ di kwa ka ọhù nke m'huru si di n'ile ya anya, dika ọhù m'huru mb͕e m'biara ibibi obodo ahu; ọhù nile di kwa ka ọhù ahu nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpuchie irum n'ala.

4Ebube nke Jehova we bata nime ulo-Ya n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu.

5Mọ Chineke we buliem elu, me ka m'bata n'ogige di nime; ma le, ebube nke Jehova juputara n'ulo ahu.

6M'we nu olu otù onye nāgwam okwu site n'ulo ahu; otù nwoke nēguzo kwa n'akukum.

7O we sim, Nwa nke madu, nka bu ebe nke oche-ezem, na ebe nke ọbu-ukwu nke ukwum abua, ebe M'gēbi n'etiti umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: ulo Israel agaghi-emeru kwa aha nsọm ọzọ, ha onwe-ha, ma-ọbu ndi-eze-ha, site n'ikwa-iko-ha, na site n'ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di elu ha;

8mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n'akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n'akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n'etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n'ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M'we ripia ha n'iwem.

9Ub͕u a ka ha wezuga ikwa-iko-ha na ozu nile nke ndi-eze-ha n'ebe di anya n'ebe M'nọ, M'gēbi kwa n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.

10Gi onwe-gi, nwa nke madu, gosi ulo Israel ulo a, ka ihere ajọ omume nile ha we me ha: ka ha tù kwa ọtùtù-ya.

11Ọ buru kwa na ihere ihe nile ha meworo eme ha, gi me ka ha mara òmùmò ulo a, na ọtùtù-ya, na ọpùpù-ya nile, na nbata-ya nile, na òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, na òmùmò-ya nile, na iwu-ya nile, de kwa ha n'akwukwọ n'anya-ha: ka ha we debe òmùmò-ya nile, na ukpuru-ya nile, me ha.

12Nka bu iwu ulo a: n'elu ugwu-ya ókè-ala-ya nile buruburu n'akuku nile di nsọ kachasi ebe nsọ nile. Le, nka bu iwu ulo a.

13Ma ndia bu ọtùtù ebe-ichu-àjà nime cubit: (cubit ahu bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka:) ala-ya bu otù cubit, ọ bu kwa otù cubit ka obosara-ya di, ókè-ya n'ọnu-ọnu-ya buruburu bu kwa otù ntù-aka: nka bu kwa ebe-ndọkwasi ebe-ichu-àjà nka.

14Site n'ala-ya nke di n'ala rue ngwe di ala di cubit abua, obosara-ya di kwa otù cubit; ma site na ngwe dikari ntà rue ngwe dikari uku di cubit anọ, obosara-ya di kwa otù cubit.

15Ebe-ichu-àjà onwe-ya di kwa cubit anọ; site n'ebe-ichu-àjà we rigo ka mpi anọ di kwa.

16Ebe-ichu-àjà di cubit iri na abua n'ogologo-ya, na cubit iri na abua n'obosara-ya, ọ rara nrata n'akuku anọ ya rara nrata.

17Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n'ogologo-ya, na cubit iri na anọ n'obosara-ya n'akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n'Iru-anyanwu.

18O we sim, Nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ndia bu ukpuru nke ebe-ichu-àjà nkem n'ubọchi ha gēme ya, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, na iwusa ọbara n'elu ya.

19I gēnye kwa ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai ndi sitere na nkpuru Zedok, ndi dim nso, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ijerem ozi, nwa-oke-ehi ibu àjà-nmehie.

20I gēwere kwa ufọdu n'ọbara-ya, tiyekwasi na mpi anọ ya, na n'elu nkuku anọ nke ngwe-ya, na n'ókè-ya buruburu: i we wepu nmehie-ya, kpuchie nmehie-ya.

21I gēwere kwa oke-ehi nke àjà-nmehie ahu, ọ gēsure kwa ya n'ebe eleputara eleputa nke ulo a, n'èzí ebe nsọ a.

22Ma n'ubochi nke-abua i gēweta nkpi nke zuru okè ibu àjà-nmehie; ha gēwepu kwa nmehie nke ebe-ichu-àjà, dika ha si were oke-ehi wepu nmehie-ya.

23Mb͕e i wepusiri nmehie-ya, i gēweta nso nwa-oke-ehi nke zuru okè, na ebulu nke zuru okè site n'ìgwè ewu na aturu-gi.

24I gēweta kwa ha nso n'iru Jehova, ndi-nchu-àjà gātusa kwa ha nnú, sure ha ọku, ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

25Ubọchi asa ka i gēdozi otù ewu kwa-ubọchi ibu àjà-nmehie: ọ bu kwa nwa-oke-ehi, na ebulu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú anu zuru okè, ka ha gēdozi.

26Ubọchi asa ka ha gēkpuchi nmehie nke ebe-ichu-àjà, me ka ọ di ọcha; ha ewe mejue ya aka.

27Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n'ubọchi nke-asatọ, we ga n'iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n'elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help