ABÙ ỌMA 1 - Bible Lgbo

AKWUKWỌ MBU

1Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu,

Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie,

Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò.

2Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di;

Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.

3Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri,

Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya,

Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu;

Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.

4Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di;

Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.

5N'ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n'ikpé,

Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume.

6N'ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume:

Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help