JEREMAIA 6 - Bible Lgbo

1Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.

2Nwayi ahu nke mara nma nke di kwa pekepeke, bú ada Zaion, ka M'gēme ka ọ la n'iyì.

3Ya ka ndi-ọzùzù-aturu na ìgwè aturu-ha gābiaru; ha ga-ama ulo-ikwū-ha n'akuku ya buruburu; ha gāzù aturu-ha, onye ọ bula n'ọnọdu nke aka ya.

4Donu agha nsọ imegide ya; bilienu, ka ayi rigo n'etiti-ehihie. Ahuhu diri ayi! n'ihi na chi eruruwo, n'ihi na onyinyo anyasi nēsetipu onwe-ha.

5Bilienu, ka ayi rigo n'abali, ka ayi bibie ulo-elu-ya nile.

6N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya.

7Dika olùlù-miri si asuputa miri-ya, otú a ka obodo ahu suputaworo ihe ọjọ ya: ihe-ike na ipunara-madu-ihe ka anānu nime ya; n'irum mb͕e nile ka ọria na ọnyá-ntiputa di.

8Ka adọ gi aka na nti, Jerusalem, ka nkpuru-obim we ghara ikewapu n'ebe i nọ; ka M'we ghara ime gi ebe tọb͕ọrọ n'efu, ala onye ọ bula nēbighi.

9Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ha gātutukọsi ndi Israel fọduru dika esi atutukọ nkpuru-vine fọduru: seghachi aka-gi dika ọghọ-nkpuru-vine n'elu alaka nile.

10Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.

11Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n'aru umu-ntakiri n'èzí, na n'aru ìzù umu-okorọbia n'otù: n'ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n'ubọchi ndu-ya.

12Agēme kwa ulo nile ha ka ha ghọ ihe ndi ọzọ, ubi-ha na ndinyom-ha n'otù: n'ihi na M'gēseti akam n'aru ndi bi n'ala nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

13N'ihi na site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha onye ọ bula bu onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku; ọzọ, site n'onye-amuma we rue onye-nchu-aja onye ọ bula nēme ihe n'ugha.

14Ha we gwọ nb͕aji ukwu na aka nke ndim nākpọghi ya ihe, si, Udo, udo; mb͕e udo nādighi.

15Ọ̀ di ihere mere ha mb͕e ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e M'letara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.

16Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.

17Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.

18N'ihi nka nurunu, unu mba nile, mara kwa, unu nzukọ, ihe di n'etiti ha.

19Nuru, gi uwa: le, Mu onwem nēme ka ihe ọjọ biakwasi ndi nka, bú nkpuru nke èchìchè nile ha, n'ihi na okwum nile ka ha nāṅaghi nti; iwum kwa, ha ajuwo ya.

20N'ìhi gini kwa ka frankincense ji biakutem site na Sheba, calamus ọma kwa site n'ala di anya? àjà-nsure-ọku-unu, ha abughi ihe natọ utọ, àjà-unu kwa, ha atọghm utọ.

21N'ihi nka ka Jehova ji kwue otú a, si, Le, M'ganētiye ihe-isu-ngọngọ di iche iche n'iru ndi nka: nna na umu-ha gāsukwasi kwa ha ngọngọ; onye-ab͕ata-obi na eyì-ya gāla n'iyì.

22Otú a ka Jehova siri, Le, otù ndi nēsi n'ala Ugwu bia: mba uku ka agākpọte kwa site na nsọtu nile nke uwa.

23Uta na ube ka ha nējide; mba di irè ka ọ bu, ha adighi-enwe obi-ebere; olu-ha nēbib͕o dika okè osimiri, ọ bu kwa inyinya ka ha nānọkwasi; edoro mba ahu n'usoro, dika onye nēbu agha, imegide gi, ada Zaion.

24Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme.

25Apula ibà n'ọhia, eje-kwa-la ije n'uzọ; n'ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.

26Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.

27Onye-ọnwunwa-ọla ka M'boro gi n'etiti ndim, ya na ebe ewusiri ike; ka i we mara nwa kwa uzọ-ha.

28Ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha nke-uku, nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ: ọla na ígwè ka ha bu: ndi ahu nile bu ndi-nbibi.

29Eko erewo ọku; ọku erechapuwo opi: n'efu ka ha nuchaworo nke-uku; n'ihi na anuchapughi ndi ọjọ.

30Ọla-ọcha ajuru aju ka akpọrọ ha, n'ihi na Jehova ajuwo ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help