ABÙ-ÁKWÁ 3 - Bible Lgbo

1Mu onwem bu nwoke ahu nke huworo nweda-n'ala site na nkpa-n'aka nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.

2Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè.

3N'ezie, mu ka Ọ nātughari aka-Ya megide ọtutu mb͕e ogologo ubọchi nile.

4O mewo ka anu-arum na akpukpọ-arum ka nká; Ọ b͕ajiwo ọkpukpum nile.

5O wuwo ńsí na ike-ọgwugwu dika ulo imegidem, were ya b͕am buruburu.

6N'ebe nile b͕ara ọchichiri ka O meworo ka m'biri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

7Ọ b͕achiwom ogige, m'we ghara ipu apu; O mewo ka ọla eji kem ab͕u di arọ́.

8Ọzọ, mb͕e m tikuru Chineke nkpu, O mechibido ekperem uzọ.

9O werewo nkume awara awa b͕achie uzọm nile, okporo-uzọm nile ka O meworo ka ha b͕agọ ab͕agọ.

10Bear nke nēche anwu ka Ọ burum, ma-ọbu ọdum nke nọ n'ebe-nzuzo di iche iche.

11Uzọm nile ka O wezugaworo, O we dọbisiem; O mewom ka m'tọb͕ọrọ n'efu.

12Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, O guzom dika ihe edotara ib͕a àkú.

13O mewo ka àkú nile nke àkpà-àkú-Ya ba n'akurum abua.

14Aghọworom ndim nile ihe-ọchi, na abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara ogologo ubọchi nile.

15O mewo ka ihe nile nke nēlu ilu jum afọ, O mewo ka m'ṅujue wormwood afọ.

16O were umu nkume kujie ezém nile, Ọ turawom na ntu.

17I juwo nkpuru-obim ka ọ ghara inọ n'udo; echezọwom ọdi-nma.

18M'we si, Ikem alawo n'iyì, ya na ncherem nke sitere na Jehova.

19Cheta nweda-n'alam na nwagharim, na wormwood na ńsí.

20Nkpuru-obim nēcheta ha nke-ọma, we ruda n'ala nimem.

21Nka ka m'nēweghachi n'obim, n'ihi nka ka m'nēchere.

22O sitere n'ebere nile nke Jehova na emeghi ka ayi gwusia, n'ihi na obi-ebere-Ya nile agwughi.

23Ha di ọhu kwa-ututu; ihe riri nne ka ikwesi-ntukwasi-obi-Gi bu.

24Òkèm bu Jehova, ka nkpuru-obim siri; n'ihi nka ka m'gēchere Ya.

25Jehova di nma n'ebe ndi nēle anya Ya nọ, Ọ di nma n'ebe nkpuru-obi nke nāchọ Ya nọ.

26Ọ di nma ka madu chere nzọputa Jehova, dere kwa du n'ichere ya.

27Ọ diri nwoke nma ka ọ nēbu yoke na mb͕e ọ di na nwata.

28Ya nọdu náni ya iche, debe ọnu-ya du, n'ihi na Ọ tukwasiwo ya n'olu-ya.

29Ya tiye ọnu-ya n'ájá; ma eleghi anya ọ di olile-anya gādi.

30Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.

31N'ihi na Onye-nwe-ayi agaghi-aju rue mb͕e ebighi-ebi.

32N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

33N'ihi na Ọ dighi-esite n'obi-Ya weda umu madu n'ala, mekpa ha aru.

34Izọpia ndi-nkpọrọ nile nke uwa n'okpuru ukwu,

35Iwezuga ikpé ọ bula n'iru Onye kachasi ihe nile elu,

36Ime ka madu b͕agọ ab͕agọ n'okwu-ikpé-ya: Onye-nwe-ayi eleghi ihe ndia anya ọma.

37Ònye bu onye ahu nke kwuworo okwu, o we rè, mgbe onyenwe-ayi enyeghi iwu?

38Ọ̀ bughi n'ọnu Onye kachasi ihe nile ka ihe ọjọ na ezi ihe si aputa?

39Gini mere madu nke di ndu ji atamu ntamu, onye ọ bula, bayere ahuhu nmehie-ya nile?

40Ka ayi gwuputa ala uzọ nile ayi, nyochaputa ha, laghachikuru Jehova.

41Ka ayi weliere Chineke Nke bi n'elu-igwe obi-ayi n'ọbu-aka-ayi abua.

42Ayi onwe-ayi ejehiewo nupu kwa isi; Gi onwe-gi ab͕agharaghi.

43I werewo iwe kpuchie Onwe-gi, we chua ayi; I b͕uwo, I nweghi ọmiko.

44I werewo igwe-oji kpuchie Onwe-gi, ka ekpere-ayi we ghara igabiga.

45Ihe azachapuru azachapu na ihe ajuru aju ka I nēme ayi n'etiti ndi nile di iche iche.

46Ndi-iro-ayi nile asaghepuwo ọnu-ha imegide ayi.

47Oké egwu na olùlù eruwo ayi aru, itọb͕ọ-n'efu na ntipia.

48Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.

49Anyam nāwusi dika miri, ọ dighi-eguzo kwa du, ghara ikwusi akwusi,

50Rue mb͕e Jehova gēsi n'elu-igwe lepu anya, hu.

51Anyam nēme nkpuru-obim ihe, n'ihi umu-ndinyom nile nke obodom.

52Ndi bu ndi-irom n'efu achusiwo ntám ike dika nnunu.

53Ha ekpochapuwo ndum n'olùlù, we tuam nkume.

54Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom.

55Esirim n'olùlù dichasi ala kpọkue aha-Gi, Jehova.

56Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.

57I biaruru nso n'ubọchi m'kpọkuru Gi: I siri, Atula egwu.

58Onye-nwe-ayi, I kpezuwo ọnu nke nkpuru-obim; I b͕aputawo ndum.

59Jehova, I huwo nb͕agọm; Gi kpe ikpem.

60I huwo ibọ̀-ọ́bọ̀ nile ha na èchìchè nile ha n'arum.

61I nuwo ita-uta-ha, Jehova, na èchìchè nile ha megidem;

62Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi nēbili imegidem, na ntughari-obi-ha megidem ogologo ubọchi nile.

63Legide inọdu-ala-ha, na nbili-ọtọ-ha; mu onwem bu abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara.

64I gēnyeghachi ha nmeso-ha, Jehova, dika ọlu aka-ha si di.

65I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha.

66I gāchu ha n'iwe, kpochapu ha n'okpuru elu-igwe nke Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help