JOSHUA 16 - Bible Lgbo

1Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el;

2o si na Bet-el pua rue Luz, gabiga rue ókè-ala ndi-Akait rue Atarot;

3ọ rida n'akuku Ọdida-anyanwu rue ókè-ala ndi-Jafletait, rue ókè-ala Bet-horon di n'okpuru, rue Gezea: ọpupu-ya we di n'oké osimiri.

4Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha.

5Ókè-ala umu Efraim, dika ab͕uru nile ha si di, we di otú a: ókè-ala nke ihe-nketa-ha n'akuku ọwuwa-anyanwu bu Atarot-ada, rue Bet-horon di n'elu;

6ókè-ala ahu we pua n'akuku Ọdida-anyanwu na Mikmetat n'Ugwu; ókè-ala ahu we b͕a buruburu n'akuku ọwuwa-anyanwu, rue Taanat-shailo, we gabiga ya n'akuku ọwuwa-anyanwu Janoa;

7o si na Janoa rida rue Atarot, ru kwa Naarah, metu Jeriko, we pua na Jọdan.

8Ókè-ala ahu siri na Tapua je n'akuku Ọdida-anyanwu rue miri-iyi Kena; ọpupu-ya we di n'oké osimiri. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Efraim dika ab͕uru nile ha si di;

9tiyere obodo nile akpaputara umu Efraim n'etiti ihe-nketa nke umu Manase, obodo ahu nile na obodo ntà nile ha.

10Ma ha anapughi ndi Kenean ndi bi na Gezea ala-ha: ndi Kenean we biri n'etiti Efraim, rue ta, ghọ ndi nēfè òfùfè orù.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help