1Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we biaghachi, kpọtem, dika onye anākpọte n'ura-ya.
2O we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ahuwom, ma, le, ihe-idọba-oriọna, nke bu nání ọla-edo ọla-edo, ya na ọkwa-ya n'isi-ya, na oriọna asa n'elu ya: ihe asa eji ab͕aye manu diri oriọna nile n'otù n'otù, bú nke di n'isi-ya:
3osisi olive abua di kwa n'akuku ya, otù n'aka-nri ọkwa ahu, na otù n'aka-ekpe-ya.
4M'we za, gwa mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu, si, Ndia bu gini, onye-nwem?
5Mọ-ozi ahu nke nāgwam okwu we za, sim, Ì maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem.
6O we za, gwam okwu, si, Nka bu okwu Jehova nke Ọ gwara Zerubabel, si, Ọ bughi site n'usu-ndi-agha, ọ bughi kwa site n'ike, kama ọ bu site na Mọm, ka Jehova nke usu-ndi-agha siri.
7Ònye ka i bu, gi oké ugwu? n'iru Zerubabel i gāghọ ebe di lari: ọ gēweputa kwa nkume nke-elu n'itiri ya oké nkpu, si, Amara, amara.
8Okwu Jehova we ruem nti, si,
9Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu.
10N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.
11M'we za, si ya, Gini bu osisi olive abua ndia nke di n'aka-nri ebe-idọba-oriọna nka na n'aka-ekpe-ya?
12M'we za nke ub͕ò abua, si ya, Gini bu ngalaba abua nke osisi olive ndia nke nēsi n'ihe ọla-edo abua eji ab͕apu manu b͕apu manu ọla-edo n'onwe-ha?
13O we gwam okwu, si, I maghi ihe ndia bu? M'we si, É-è, onye-nwem.
14Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.