JOB 13 - Bible Lgbo

1Le, ihe a nile ka anyam huworo,

Ntim anuwo, ghọta kwa ya.

2Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem:

Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.

3Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu,

Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.

4Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,

Ndi-dibia efu ka unu nile bu.

5Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!

Ọ we ghọro unu amam-ihe.

6Biko, nurunu iru-ukam,

Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.

7Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?

Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?

8Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?

Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?

9Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?

Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?

10Ọ ghaghi ibara unu nba,

Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.

11Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku?

Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?

12Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu,

Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.

13B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem,

Gini gāgabiga kwa n'arum?

14N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém,

Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?

15Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere:

Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.

16Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa;

N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.

17Nurunu okwum nile nke-ọma,

Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.

18Biko, le, edowom ikpém n'usoro;

Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.

19Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe?

N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.

20Nání emelam ihe abua,

Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:

21Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya;

Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.

22Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;

Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.

23Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole?

Me ka m'mara njehiem na nmehiem.

24N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,

Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?

25Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?

Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?

26N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem,

I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:

27I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya;

I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:

28Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká,

Dika uwe nke nla riworo.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help