II. IHE EMERE 12 - Bible Lgbo

1O rue, mb͕e emere ka ala-eze Rehoboam guzosie ike, mb͕e ọ di kwa ike, na ọ rapuru iwu Jehova, ya na Israel nile.

2O rue n'arọ nke-ise nke eze, bú Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem, (ọ bu n'ihi na ha mekpuru emekpu megide Jehova,)

3ya na nnù ub͕ọ-ala atọ na orú nnù ndi-inyinya uzọ asa na nnù iri: ndi soro ya si n'Ijipt bia enweghi kwa ọnu-ọgugu; bú ndi-Lubim, na ndi-Sukim, na ndi Etiopia.

4O we were obodo nile ewusiri ike nke Juda nwere, we biarue Jerusalem.

5Ma Shemaia, bú onye-amuma, biakutere Rehoboam na ndi-isi Juda, ndi achikọtara rue Jerusalem n'ihi Shaishak, ọ si ha, Otú a ka Jehova siri, Unu onwe-unu arapuwom, ọzọ kwa, Mu onwem arapuwo unu n'aka Shaishak.

6Ndi-isi Israel na eze we weda onwe-ha n'ala, si, Onye ezi omume ka Jehova bu.

7Ma mb͕e Jehova huru na ha wedara onwe-ha n'ala, okwu Jehova ruru Shemaia nti, si, Ha ewedawo onwe-ha n'ala; M'gaghi-ebibi ha: kama M'gēnye ha nb͕apu na mb͕e ntà, agaghi-awusi kwa ọnumam na Jerusalem site n'aka Shaishak.

8Otú ọ di, ha gāburu ya orù; ka ha we mara òfùfèm, na òfùfè ala-eze nke ala ọzọ.

9Shaishak, bú eze Ijipt, we rigota imegide Jerusalem, we wepu àkù nile nke ulo Jehova na àkù nile nke ulo eze; ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.

10Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.

11O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ biara we būru ha, bughachi kwa ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.

12Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda.

13Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike na Jerusalem, o we buru eze: n'ihi na Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri-na-asa na Jerusalem, bú obodo ahu nke Jehova rọputara n'ebo nile nke Israel, ido aha-Ya n'ebe ahu: aha nne-ya bu Neama nwayi Amon.

14O we me ihe ọjọ, n'ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova.

15Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n'akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.

16Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid: Abaija nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help