ABÙ ỌMA 26 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke Devid.

1Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm:

Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu.

2Nwà m, Jehova, nwaputakwam;

Nucha akurum abua na obim.

3N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam;

Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi.

4Mu na madu efu anọkọghi;

Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa.

5Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì,

Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa.

6Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ;

We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova:

7Ime ka ege nti olu ekele,

Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

8Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya,

Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.

9Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù,

Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù:

10Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha,

Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo.

11Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije:

B͕aputam, me-kwa-ram amara.

12Ukwum eguzowo n'ala di lari:

Nime nkpọkọta madu nile ka m'gāgọzi Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help