ABÙ ỌMA 85 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma umu Kora.

1Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ:

I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.

2I bupuwo ajọ omume ndi-Gi,

I kpuchiwo nmehie-ha nile. Selah

3I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi:

I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.

4Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi,

Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.

5Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka I ganēwesa ayi iwe?

Ì gēme ka iwe-Gi digide rue ọb͕ọ nile?

6Gì onwe-gi agaghi-eme ka ayi di kwa ndu ọzọ:

Ka ndi-Gi we ṅuria nime Gi?

7Jehova, me ka ayi hu ebere-Gi,

Nye kwa ayi nzọputa-Gi.

8M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu:

N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo:

Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.

9Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya;

Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi.

10Ebere na ezi-okwu ezutewo;

Ezi omume na udo esutuwo ọnu.

11Ezi-okwu nēpú epú n'ala;

Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya.

12Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe;

Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya.

13Ezi omume gāga n'iru Ya;

Ọ gēme kwa ka nzọ-ukwu-Ya nile ghọ uzọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help