I. SAMUEL 6 - Bible Lgbo

1Ib͕e Jehova we di n'ọhia ndi Filistia ọnwa asa.

2Ndi Filistia we kpọ ndi-nchu-aja na ndi nāju ase, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Jehova? me ka ayi mara ihe ayi gēji zilaga ya n'ebe-ya.

3Ha we si, Ọ buru na unu ezilaga ib͕e Chineke Israel, ezilagala ya n'aka efu; kama unu aghaghi inyeghachi Ya àjà-ikpe-ọmuma: mb͕e ahu agēme ka aru-unu di ike, agēme kwa ka unu mara ihe mere anēwezugaghi aka-Ya n'aru unu.

4Ha we si, Gini gābu àjà-ikpe-ọmuma ahu nke ayi gēnyeghachi Ya? Ha we si, Dika ọnu-ọgugu ndi-isi ndi Filistia si di, ọ bu emerod ọla-edo ise na òké ọla-edo ise ka unu gēnyeghachi: n'ihi na otù ihe-otiti diri ha nile, di-kwa-ra ndi-isi-unu.

5Unu gēme kwa onyinyo emerod-unu, na onyinyo òké-unu nke nēbibi ala-unu; unu gēnye kwa Chineke Israel nsọpuru: eleghi anya Ọ gēme ka aka-Ya di nfé pua n'aru unu, na n'aru chi nile unu, na n'ala-unu.

6N'ìhi gini kwa ka unu nēme ka obi-unu di arọ́, dika ndi Ijipt na Fero mere ka obi-ha di arọ́? mb͕e Ọ kwara ha emò, hà ezilagaghi ha, ha we la?

7Ma ub͕u a, werenu ihe me otù ub͕ọ-ala ọhu, chiri kwa nne-ehi abua nke nēnye umu ara, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n'ub͕ọ-ala, me ka umu-ha si n'iso ha n'azu lata n'ulo:

8were-kwa-nu ib͕e Jehova tiyekwasi ya n'ub͕ọ-ala ahu; tiye ihe ọla-edo ahu, nke unu nēnyeghachi Ya ka ọ buru àjà-ikpe-ọmuma, n'ib͕e ntà n'akuku-ya; zilaga-kwa-nu ya, ka ọ we la.

9Le-kwa-nu, ọ buru na ọ rigo n'uzọ ókè-ala-ya rue Bet-shemesh, Ya onwe-ya emewo ayi oké ihe ọjọ a: ma ọ buru na ọ rigoghi otú a, ayi gāma kwa na ọ bughi aka-Ya tib͕uru ayi; ihe-ndabà ka ihe ahu bu, nke dabara ayi.

10Ndikom ahu we me otú a; ha chiri nne-ehi abua nke nēnye umu ara, kegide ha n'ub͕ọ-ala ahu, mechibido umu-ha uzọ n'ulo:

11ha we tukwasi ib͕e Jehova n'ub͕ọ-ala ahu, na ib͕e ntà ahu, na òké ọla-edo, na onyinyo emerod-ha.

12Ehi ahu we jezie ejezi n'uzọ rue uzọ Bet-shemesh: ọ bu n'otù uzọ atuliri atuli ka ha jere, nēje nēti nkpu, ha ewezugaghi kwa onwe-ha n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe; ndi-isi ndi Filistia we nējeso ha n'uzọ rue ókè-ala Bet-shemesh.

13Ma ndi Bet-shemesh nēbì ọka wheat-ha na ndagwurugwu: ha we welie anya-ha, hu ib͕e ahu, ṅuria ọṅu ihu ya.

14Ub͕ọ-ala ahu we ba n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, guzo n'ebe ahu, nkume uku di kwa n'ebe ahu: ha we kpọwa osisi ub͕ọ-ala ahu, sure ehi abua ahu ọku ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova.

15Ndi Livai we buda ib͕e Jehova na ib͕e ntà nke di n'akuku ya, nke ihe ọla-edo ahu nile di nime ya, ha we tukwasi ha na nkume uku ahu: ndikom Bet-shemesh we sure àjà-nsure-ọku, chu-kwa-ra Jehova aja ọzọ, n'ubọchi ahu.

16Ndi-isi ise nke ndi Filistia we hu ya, laghachi rue Ekron n'ubọchi ahu.

17Ndia bu emerod ọla-edo nke ndi Filistia nyeghachiri, ibu àjà-ikpe-ọmuma ichuru Jehova; Ashdod nwere otù, Geza nwere otù, Ashkelon nwere otù, Gat nwere otù, Ekron nwere otù;

18òké ọla-edo kwa, dika ọnu-ọgugu obodo nile nke ndi Filistia si di, bú nke ndi-isi ise ahu nwere, site n'obodo ewusiri ike we rue obodo ntà nke nēnweghi mb͕idi: we rue nkume uku ahu, bú Ebel, nke ha dọbara ib͕e Jehova n'elu ya: ọ di n'ubi Joshua, bú onye Bet-shemesh, rue ta.

19O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n'ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n'etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n'ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n'etiti ndi Israel.

20Ndikom Bet-shemesh we si, Ònye puru iguzo n'iru Jehova, bú Chineke nsọ a? Ọ̀ bu kwa onye ka O gēsi n'ebe ayi nọ rigokuru?

21Ha we zigara ndi bi na Kiriat-jearim ndi-ozi, si, Ndi Filistia ebughachiwo ib͕e Jehova; ridatanu, bugo ya n'ebe unu nọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help