1Ndi nātukwasi Jehova obi
Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.
2Jerusalem, ugwu-ya nile di ya buruburu:
Otú a ka Jehova di ndi-Ya buruburu.
Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
3N'ihi na nkpa-n'aka-eze nke nmebi-iwu agaghi-adigide n'elu ihe ruru ndi ezi omume n'ife-nzà;
Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha tiye n'ajọ omume.
4Jehova, me ndi di nma nma,
Me kwa ndi ziri ezi n'obi-ha nma.
5Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ,
Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la.
Ka udo dikwasi Israel.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.