ỌNU-ỌGUGU 3 - Bible Lgbo

1Ma ndia bu osuso-ọmumu nile nke Eron na Moses n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ugwu Sainai.

2Ndia bu kwa aha umu-ndikom Eron;ọkpara-ya, bú Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.

3Ndia bu aha nke umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà ndi etere manu, ndi ọ mejuru aka ibu ndi-nchu-àjà.

4Nedab na Abaihu we nwua n'iru Jehova, mb͕e ha wetara nso ọku ala ọzọ n'iru Jehova n'ọzara Sainai, ha enweghi kwa nwa; Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà n'iru Eron, bú nna-ha.

5Jehova we gwa Moses okwu, si,

6Me ka ebo Livai biaru nso, guzo kwa ha n'iru Eron, bú onye-nchu-àjà, ka ha we jere ya ozi.

7Ha gēdebe kwa ihe-ndebe-ya na ihe-ndebe nke nzukọ Israel nile n'iru ulo-ikwū nzute, ifè òfùfè nke ebe-obibim.

8Ha gēdebe kwa ihe nile nke ulo-ikwū nzute, na ihe-ndebe nke umu Israel, ifè òfùfè nke ebe-obibim.

9I gēwere kwa ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom: ndi enyesiworo aha ha nile site n'etiti umu Israel ka ha bu.

10I gēwere kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha buru ndi-nlekọta, ha gēdebe kwa ọlu-nchu-àjà-ha: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

11Jehova we gwa Moses okwu, si,

12Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were ndi Livai n'ọnọdu nwa ọ bula eburu uzọ mu nke nēmeghe àkpà nwa n'etiti umu Israel; ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere:

13n'ihi na Mu nwe nwa ọ bula eburu uzọ mu; n'ubọchi M'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro umu nile eburu uzọ mu n'Israel nsọ nye onwem, ma madu ma anumanu: nkem ka ha bu; Mu onwem bu Jehova.

14Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, si,

15Gukọta umu Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, dika ab͕uru nile ha si di; nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru ka i gāgukọta ha.

16Moses we gukọta ha n'okwu-ọnu Jehova, dika enyere ya iwu.

17Ndia bu kwa umu-ndikom Livai n'aha-ha; Giashon, na Kohat, na Merari.

18Ndia bu kwa aha umu-ndikom Giashon dika ab͕uru nile ha si di; Libni na Shimai.

19Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.

20Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

21Nke Giashon bu ab͕uru ndi Libni, na ab͕uru ndi Shimai: ndia bu ab͕uru ndi Giashon.

22Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ndi-ha águkotara agukọta di nnù iri-na-asatọ na ọgu iri-na-ise.

23Ab͕uru abua nke ndi Giashon nāma ulo-ikwū-ha n'azu ebe-obibi ahu chere iru n'Ọdida-anyanwu.

24Onye-isi ulo nna ndi Giashon nwere bu Eliasaf nwa Lael.

25Ihe-ndebe nke umu-ndikom Giashon n'ulo-ikwū nzute bu ebe-obibi na Ulo-ikwū, na ihe-nkpuchi-ya, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute,

26na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ ogige, nke di n'akuku ebe-obibi, na n'akuku ebe-ichu-àjà buruburu, na udọ̀-ya nile bayere òfùfè-ya nile.

27Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.

28N'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, ha di orú nnù na otù nnù ọgu iri, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.

29Ab͕uru nile nke umu Kohat nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.

30Onye-isi ulo nna ab͕uru ndi Kohat nwere bu Elizafan nwa Uziel.

31Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile.

32Onye-isi nke ndi-isi nke ndi Livai bu Eleeza nwa Eron onye-nchu-àjà, ọ nwere nlekọta ndi nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu.

33Nke Merari bu ab͕uru ndi Mahli, na ab͕uru ndi Mushi: ndia bu ab͕uru Merari.

34Ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di nnù iri-na-ise na ọgu iri.

35Onye-isi ulo nna nke ab͕uru abua Merari nwere bu Zuriel nwa Abihail: ha nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu.

36Nlekọta nke ihe-ndebe nke umu Merari bu ibo nile nke ebe-obibi ahu, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na akwa ya nile, na ihe-ya nile, na òfùfè-ya nile:

37na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha.

38Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'iru ebe obibi ahu chere iru n'Iru-anyanwu, n'iru ulo-ikwū nzute chere iru n'ọwuwa-anyanwu, bu Moses, na Eron na umu-ya ndikom, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu, bú ihe-ndebe nke umu Israel; onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

39Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.

40Jehova we si Moses, Gukọta umu-ndikom nile eburu uzọ muru umu Israel, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, guta kwa ọnu-ọgugu aha-ha.

41I gēwe-kwa-ram ndi Livai (Mu onwem bu Jehova) n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel; na anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti anu-ulo umu Israel.

42Moses we gukọta umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, dika Jehova nyere ya iwu.

43Ndikom nile eburu uzọ mu, n'onu-ọgugu aha, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-ise na ọgu iri-na-atọ na iri na atọ.

44Jehova we gwa Moses okwu, si,

45Were ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, were kwa anu-ulo ndi Livai n'ọnọdu anu-ulo-ha: ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere; Mu onwem bu Jehova

46Ma ndi anāb͕aputa, bú ọgu madu iri-na-atọ na madu iri na atọ ahu sitere na ndi eburu uzọ mu nke umu Israel, ndi eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu,

47n'aka-ha ka i gānara shekel ise shekel ise n'isi n'isi; dika shekel nke ebe nsọ ahu si di ka i gēwere ha (shekel bu orú gerah):

48i gēnye kwa Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ahu ewere b͕aputa ndi ahu eji ka ndi Livai n'ọnu-ọgugu

49Moses we nara ego nb͕aputa ahu n'aka ndi fọduru n'ọnu-ọgugu ndi ahu ndi Livai b͕aputara:

50n'aka umu eburu uzọ mu nke umu Israel ka ọ nara ego ahu; nnù shekel atọ na ọgu asatọ na ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di;

51Moses we nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, ego ndi ab͕aputara, n'okwu-ọnu Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help