ABÙ ỌMA 17 - Bible Lgbo

Ekpere Devid.

1Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum;

Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe.

2Ka ikpém si n'iru Gi puta;

Anya-Gi nāhu izi-ezi.

3I nwawo obim; I letawom n'abali;

I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe;

Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè.

4Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-Gi

Ka mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya.

5Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile,

Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha.

6Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke:

Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum.

7Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime Gi

Site n'iru ndi nēbili imegide ha.

8Debem dika nwa-anya-Gi,

Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi,

9Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe,

Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu.

10Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba:

Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.

11Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi:

Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala.

12Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike,

Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo.

13Bilie, Jehova,

Buru ya uzọ, me ka o ruru ala:

Me ka nkpuru-obim b͕apu n'aka ndi nēmebi iwu site na mma-agha-Gi;

14N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova,

N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a,

Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba:

Afọ nēju ha n'umu,

Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru.

15Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi:

Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help