HOSEA 14 - Bible Lgbo

1Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n'ihi na i suwo ngọngọ site n'ajọ omume-gi.

2Chirinu okwu n'aka-unu laghachikute Jehova: sinu Ya, Bupu ajọ omume nile ayi, nara ezi ihe: ayi ewe kwughachi eb͕ub͕ere-ọnu-ayi, dika oke-ehi.

3Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.

4M'gāgwọ ndaghachi-azu-ha, M'gāhu ha n'anya n'afọ-ofufo: n'ihi na iwem esiwo n'aru ya chigharia.

5M'gādiri Israel dika igirigi, ọ gāma ifuru dika urodi, b͕asa nkpọrọgwu-ya nile dika Lebanon.

6Ome-ya nile gāwasa, ima-nma-ya gādi kwa ka osisi olive, ísì ọma o nēsì gādi ka Lebanon.

7Ndi bi n'okpuru ǹdò-ya gālata, me ka ọka di ndu, ha gāma ifuru dika osisi vine: ihe-ncheta-ya gādi ka manya-vine nke Lebanon.

8Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi.

9Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help