JEMES 4 - Bible Lgbo

1Òle ebe ibu-agha si bia, òle ebe kwa ilu-ọ̀gù si bia, bú nke di n'etiti unu? ọ̀ bughi n'ebe ahu, bú ihe-utọ nile unu nke nēbu agha n'ihe nile di unu n'aru, ka ha si bia?

2Agu nāgu unu, ma unu enwegh: unu nēb͕u madu, nēkwo kwa ekworo, unu apughi kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọ̀gù, nēbu kwa agha; unu enweghi, n'ihi na unu ariọghi.

3Unu nāriọ, ma unu adighi-anata ihe, n'ihi na unu nāriọ n'obi ọjọ, ka unu we mefu ya n'ihe-utọ nile unu.

4Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.

5Ma-ọbu ùnu nēchè na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu okwu n'efu? Àgu ayi nāgusi Mọ ahu ike n'uzọ ekworo, bú Mọ Nke O mere ka O biri nime ayi?

6Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.

7Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.

8Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.

9Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru.

10Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.

11Umu-nnam, unu ekwutọritala ibe-unu. Onye nēkwutọ nwa-nna-ya, ma-ọbu nēkpe nwa-nna-ya ikpé, o nēkwutọ iwu, nēkpe kwa iwu ikpé: ma ọ buru na i nēkpe iwu ikpé, i bughi onye nēdebe iwu, kama i bu onye-ikpé-ya.

12Nání otù Onye bu onye nēnye iwu, buru kwa onye-ikpé, bú Onye ahu Nke puru izọputa na ila ihe n'iyì: ma gì onwe-gi bu onye, gi onye nēkpe onye-ab͕ata-obi-gi ikpé?

13Genu nti, unu ndi nāsi, Ta ma-ọbu echi ka ayi gāga obodo a, nọ kwa n'ebe ahu otù arọ, zu kwa ahia, rita kwa urù:

14ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.

15Ma nke kwesiri unu ka unu kwue bu, Asi na Onye-nwe-ayi chọrọ, ayi gādi ndu, me kwa ihe a ma-ọbu ihe ahu.

16Ma otú ọ di, unu nānya isi n'oké okwu-unu: inya-isi nile di otú a bu ajọ ihe.

17Ya mere onye matara ime ihe ọma, ma ọ meghi ya, ọ buru onye ahu nmehie.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help