ABÙ ỌMA 135 - Bible Lgbo

1Tonu Ja.

Tonu aha Jehova;

Tonu Ya, ndi-orù Jehova:

2Ndi nēguzo n'ulo Jehova,

N'ogige nile nke ulo Chineke-ayi.

3Tonu Ja; n'ihi na Jehova di nma:

Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n'ihi na ọ di utọ.

4N'ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya,

Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya.

5N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku,

Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile.

6Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo,

N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile.

7Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo;

O meworo miri-ozuzo àmùmà;

Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.

8Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt,

Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo.

9O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'etiti gi, Ijipt,

N'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile.

10Onye tib͕uru ọtutu mba,

B͕u kwa ndi-eze di ike;

11Bú Saihon eze ndi-Amorait,

Na Og eze Beshan,

Na ala-eze nile nke Kenean:

12Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa,

Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa.

13Jehova, aha-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi;

Jehova, ncheta-Gi nādiru ọb͕ọ nile.

14N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe,

Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya.

15Arusi nile nke mba nile bu ọla-ọcha na ọla-edo,

Ọlu aka madu.

16Ha nwere ọnu ma ha adighi-ekwu okwu;

Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ;

17Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti;

Ọ dighi kwa iku-ume di n'ọnu-ha.

18Ndi nēme ha gādi ka ha;

E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi.

19Ulo Israel, gọzienu Jehova:

Ulo Eron, gọzienu Jehova:

20Ulo Livai, gọzienu Jehova:

Unu ndi nātu egwu Jehova, gọzienu Jehova.

21Onye agọziri agọzi ha Jehova bu site na Zaion,

Onye bi na Jerusalem. Tonu Ja.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help