ABÙ ỌMA 124 - Bible Lgbo

Abú Nrigo; nke Devid.

1Asi na ọ bughi Jehova Nke diri ayi,

Biko, ka Israel kwue otú a, si;

2Asi na ọ bughi jehova Nke diri ayi,

Mb͕e madu biliri imegide ayi:

3Mb͕e ahu ha gēlowori ayi na ndu,

Mb͕e iwe-ha di ọku n'aru ayi:

4Mb͕e ahu miri gēruchapuwori ayi,

Miri-iyi gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi.

5Mb͕e ahu miri di nganga gāgabigawori n'elu nkpuru-obi-ayi.

6Onye agọziri agọzi ka Jehova bu,

Onye nēnyeghi ayi iburu ezé-ha anu-ndọb͕u.

7Nkpuru-obi-ayi ewepugawo onwe-ya dika nnunu n'ib͕udu ndi-osi-ọnyà:

Ib͕udu ahu kpajiri akpaji, ayi onwe-ayi we wepuga onwe-ayi.

8Iye-aka-ayi di n'aha Jehova,

Onye meworo elu-igwe na uwa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help