ABÙ ỌMA 19 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke;

Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi.

2Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba,

Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma.

3Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di;

Anughi olu-ha.

4N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue,

Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.

O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.

5Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n'ulo-ndina-ya puta,

Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya.

6Site n'otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di,

Ib͕a-buruburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile:

Ọ dighi kwa ihe ezonarioworo okpom-ọku-ya.

7Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi:

Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe.

8Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu:

Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè.

9Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi:

Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù.

10Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha:

Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.

11Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti:

N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.

12Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha?

Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.

13B͕ochi kwa orù-Gi na nmehie-nganga;

Ekwela ka ha nāchim: mb͕e ahu ka m'gēzu okè,

Agāgukwam n'onye ikpe njehie riri nne nāmaghi.

14Ka okwu nile nke ọnum na ntughari nke obim buru ihe nātọ utọ n'iru Gi,

Jehova, bú oké nkumem, na onye-nb͕aputam.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help