ABÙ ỌMA 90 - Bible Lgbo

Ekpere Moses, Bú onye nke Chineke.

1Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayi

N'ọb͕ọ nile.

2Tutu amuputa ugwu,

Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi,

Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke.

3I nēme ka madu laghachi n'ájá;

I we si, Laghachinu, umu madu.

4N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-Gi

Di ka nnyahuru mb͕e ọ nāga,

Na dika otù nche n'abali.

5I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu:

N'ututu ha di ka ahihia nētó etó.

6N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó;

N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua.

7N'ihi na emewo ka ayi gwusia n'iwe-Gi,

Ọ bu kwa n'ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji.

8I dowo ajọ omume nile ayi n'iru Gi,

I dowo nmehie-ayi zoro ezo n'ìhè nke iru-Gi.

9N'ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi:

Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume.

10Ubọchi arọ nile ayi di ọgu arọ atọ na iri;

Ma ọ buru na ha esite n'idi-ike-ayi rue ọgu arọ anọ,

Otú ọ di, nganga-ha bu nání idọb͕u-onwe-ha-n'ọlu na ajọ ihe;

N'ihi na ọ b͕apuwo ọsọsọ, ayi we fela dika nnunu.

11Ònye mara ike nke iwe-Gi,

Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?

12Si otú a me ka ayi mara iguta ubọchi-ayi,

Ka ayi we me ka obi amam-ihe bia.

13Lata, Jehova; rùe ole mb͕e?

Chèghari kwa obi-Gi bayere ndi-orù-Gi.

14Were ebere-Gi me ka afọ ju ayi n'ututu;

Ka ayi we tie nkpu ọṅù, ṅuri kwa, ubọchi-ayi nile.

15Me ka ayi ṅuria dika ubọchi nile si di I wedaworo ayi n'ala nime ha,

Na dika arọ si di nke ayi huworo ihe ọjọ nime ha.

16Kwe ka ndi-orù-Gi hu ọlu-Gi,

Kwe kwa ka ahu ima-nma-Gi n'aru umu-ha.

17Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, dikwasi ayi:

Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n'aru ayi;

E, ọlu aka-ayi, me ka o guzosie ike.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help