ABÙ ỌMA 69 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shoshannim. Abù Ọma nke Devid.

1Zọputam, Chineke;

N'ihi na miri abiaruwo nkpuru-obim.

2Emikpuwom n'urọ nke ebe di omimi, ọ dighi kwa ebe-nguzo di:

Abatawom na miri nke miri emi, miri nke nērù ọku ọku na-enudakwa m.

3Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku:

Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem.

4Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu:

Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha:

Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike.

5Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ;

Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile.

6Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha:

Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel.

7N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta;

Ihere ekpuchiwo irum.

8Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ,

Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.

9N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom;

Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam.

10M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim,

O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.

11Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem,

M'we ghọrọ ha ilu.

12Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem;

Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara.

13Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ:

Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi,

Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.

14Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe.

Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi.

15Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum,

Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam;

Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya.

16Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma:

Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru.

17Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi;

N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.

18Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya:

N'ihi ndi-irom b͕aputam.

19Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem:

N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.

20Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike:

M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula;

M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.

21Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm;

Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.

22Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu;

Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà.

23Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ;

Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.

24Wukwasi ha iwe-Gi,

Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru.

25Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu;

Ekwela onye ọ bula bi n'ulo-ikwū nile ha.

26N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo;

Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.

27Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha:

Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi.

28Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu,

Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.

29Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u:

Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu.

30M'gēji abù to aha Chineke,

M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku.

31Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi,

Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa.

32Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri:

Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu.

33N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye,

Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya.

34Ka elu-igwe na ala to Ya,

Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha.

35N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda;

Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya.

36Nkpuru nke ndi-orù-Ya gēketa kwa ya;

Ndi nāhu aha-Ya n'anya gēbi kwa nime ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help