I. IHE EMERE 16 - Bible Lgbo

1Ha we bubata ib͕e Chineke, guzo ya n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: ha we weta nso àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Chineke.

2Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova.

3Ọ we kesara madu ọ bula n'Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otù ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami.

4O we tiye ufọdu nime ndi Livai n'iru ib͕e Jehova, bú ndi nēje ozi, ọbuná ime ka echeta na ikele na ito Jehova, bú Chineke Israel:

5ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;

6Benaia na Jehaziel, bú ndi-nchu-àjà, nāchiri kwa opì mb͕e nile, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke.

7Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.

8Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya;

Menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile n'uwa.

9Bùkuenu Ya abù, bùkuenu Ya abù ọma;

Tugharinu uche n'oké ọlu-Ya nile.

10Nētonu onwe-unu n'aha nsọ Ya:

Ka obi ndi nāchọ Jehova ṅuria.

11Nāchọnu Jehova na ike-Ya;

Chọnu iru-Ya mb͕e nile.

12Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo;

Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;

13Unu nkpuru Israel, bú orù-Ya,

Umu Jekob, ndi-Ya arọputara.

14Ya onwe-ya bu Jehova, bú Chineke-ayi:

N'uwa nile ka ikpé-Ya nile di.

15Chetanu ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi ebi,

Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;

16Ọb͕ub͕a-ndu nke Ya na Abraham b͕ara,

Na iyi-Ya Ọ ṅuru Aisak;

17O we me ka o guzoro Jekob ibu ukpuru,

Ka o guzoro Israel ibu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi:

18Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean,

Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:

19Mb͕e unu bu ndikom ole-na-ole;

E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;

20Ha we nējeghari si n'otù mba jerue mba ọzọ,

Si n'otù ala-eze jerue ndi ọzọ.

21O kweghi ka nwoke ọ bula meb͕ue ha;

O we bara ndi-eze nba n'ihi ha;

22Si, Unu emetula ndim etere manu aka,

Unu emejo-kwa-la ndi-amumam.

23Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile;

Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

24Kọsanu akukọ nsọpuru-Ya n'etiti mba nile,

Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

25N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:

Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu kwa n'elu chi nile.

26N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:

Ma Jehova mere elu-igwe.

27Ebube na ima-nma di n'iru Ya:

Ike na ọṅù di n'ebe-Ya.

28Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

29Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:

Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bia n'iru Ya:

Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ.

30Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.

31Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;

Ka ha si kwa n'etiti mba nile, Jehova bu eze.

32Ka oké osimiri bib͕ọ, ya na ùjú-ya;

Ka obi tọ ọhia utọ, ya na ihe nile nke di nime ya;

33Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù n'iru Jehova,

N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe.

34Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma:

N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

35Si-kwa-nu, Zọputa ayi, Chineke nzọputa-ayi,

Chikọta kwa ayi, naputa ayi n'aka mba nile,

Ikele aha nsọ Gi,

Na inya isi n'otuto-Gi.

36Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu,

Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.

37O we rapu n'ebe ahu, n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, Esaf na umu-nne-ya, ije ozi n'iru ib͕e ahu mb͕e nile, dika ihe ubọchi n'ubọchi-ya si di:

38na Obed-edom na umu-nne-ha, ọgu ndikom atọ na asatọ; na Obed-edom nwa Jedutun, na Hosa, ibu ndi-ọnu-uzọ-ama:

39na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon,

40isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu;

41ha na Himan na Jedutun, na ndi fọduru nime ndi arọputara arọputa, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di;

42ha na Himan na Jedutun, ndi chiri opì na ájà inye ndi nēme ka anu udà-ha, chiri kwa ihe abù Chineke: na umu Jedutun, inọ n'ọnu-uzọ-ama.

43Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya: Devid we lata igọzi ulo-ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help