I. SAMUEL 2 - Bible Lgbo

1Hana we kpe ekpere, si:

Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova,

Mpim adiwo elu n'ime Jehova:

Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom,

N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.

2Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova;

N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi:

Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.

3Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu;

Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta:

N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu,

Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.

4Anyajiwo uta ndi-dike,

Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké.

5Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri;

Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu:

Ebe nwanyi àgà muworo umu asa;

Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.

6Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu:

Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.

7Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya:

Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.

8Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie,

Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu,

Ime ka ha na ndi-isi nọdu,

Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru:

N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa,

O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.

9Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe,

Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri;

N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.

10Agētipia ndi nāchọ Jehova okwu;

Ọ gāmakwasi ha éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe:

Jehova gēkpe nsọtu nile nke uwa ikpe;

Ọ gēnye kwa eze-Ya ike,

Me kwa mpi onye-Ya etere manu ka ọ di elu.

11Elkena we la Rema rue ulo-ya. Nwata ahu we nējere Jehova ozi n'iru Ilai, bú onye-nchu-àjà.

12Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.

13Ikpe ekpere banyere ndi-nchu-àjà n'ebe ndi Israel nọ bu nka, mb͕e nwoke ọ bula nāchu àjà, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà we bata, mb͕e anēsi anu, nduri nke wara ezé atọ di n'aka-ya;

14o we dubà ya n'ite ọku, ma-ọbu n'ite isi miri, ma-ọbu n'ite isi anu, ma-ọbu n'ite ọzọ; ihe ọ bula ndudu ahu dulitere ka onye-nchu-àjà nēwere na ya. Otú a ka ha nēme Israel nile n'ime Shailo, bú ndi nābia n'ebe ahu.

15Ọzọ, tutu ha esure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà biara, si nwoke ahu nke nāchu àjà, Nye anu iruru onye-nchu-àjà; ọ gaghi-anara kwa anu esiri esi n'aka-gi, kama anu ndu.

16Ma ọ buru na nwoke ahu asi ya, Ha aghaghi isure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ dika anēme ta, emesia nara n'onwe-gi dika nkpuru-obi-gi si achọ; ọ gāsi kwa, É-è, kama ub͕u a ka i gēnyem: ma ọ buru na i nyeghm, m'gānara ya n'ike.

17Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova.

18Ma Samuel nēje ozi n'iru Jehova, buru nwata, ewerewo kwa ephod nke ákwà ọcha ke ya dika ihe-ọkiké.

19Nne-ya we mere ya uwe-nwuda ntà, chigoro ya kwa-arọ, mb͕e o soro di-ya rigo ichu àjà arọ.

20Ilai we gọzie Elkena na nwunye-ya, si, Jehova doro gi nkpuru site na nwayi a n'ọnọdu ihe-nriọta ariọtara Jehova. Ha we la n'ebe-ha.

21N'ihi na Jehova letara Hana, o we turu ime, mua umu-ndikom atọ na umu-ndinyom abua. Nwata ahu, bú Samuel, we nētó n'ulo Jehova.

22Ma Ilai emewo agadi nke-uku; o we nu ihe nile umu-ya ndikom nēme Israel nile, na otú ha nēso ndinyom ahu dina, bú ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute.

23O we si ha, N'ìhi gini ka unu nēme ihe dika ihe ndia? n'ihi na mu onwem nānu ihe ọjọ nile unu n'ọnu ndi nka nile.

24É-è, umum; n'ihi na ọ dighi nma, bú akukọ nke mu onwem nānu: unu nēme ka ndi Jehova jehie.

25Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n'ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua

26Nwa-okoro ahu, bú Samuel, we nētó nāga n'iru, o we di nma, ma n'ebe Jehova nọ, ma n'ebe madu nọ.

27Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n'ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n'Ijipt buru orù nye ulo Fero?

28Èsim n'ebo nile nke Israel rọputa ya iburum onye-nchu-àjà, irigo rue ebe-ichu-àjàm, isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, iyiri ephod n'irum? ènye-kwa-ram ulo nna-gi àjà-ọku nile nke umu Israel?

29N'ìhi gini ka unu nāzọkwasi àjàm ukwu, zọkwasi kwa onyinye-inata-iru-ọmam, nke M'nyeworo n'iwu n'ebe-obibim; i we nāsọpuru umu-gi ndikom karim, ime onwe-unu ka unu ma abuba site n'ihe kachasi nma nke onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke Israel, bú ndim?

30N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.

31Le, ubọchi nābia, na M'gēbipu ogwe-aka-gi na ogwe-aka ulo nna-gi, na agadi agaghi-adi n'ulo-gi.

32I gēlegide kwa onye-nkpab͕u n'ebe-obibim, n'ezi ihe nile nke Chineke gēmere Israel: agadi agaghi-adi kwa n'ulo-gi ubọchi nile.

33Ma nwoke nke diri gi, nke M'nāgaghi-ebipu n'ebe-ichu-àjàm, gābu ime ka anya-gi abua hubìe uzọ, na imekpa nkpuru-obi-gi aru: ọmùmù nile nke ulo-gi gānwu tutu ha erue agadi.

34Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu.

35Ma M'gēme ka onye-nchu-àjà nke kwesiri ntukwasi-obi bilierem, ọ bu dika ihe si di nke di nime obim na nime nkpuru-obim ka ọ gēme: M'gēwu-kwa-ra ya ulo kwesiri ntukwasi-obi, ọ gējeghari kwa n'iru onye nkem etere manu ubọchi nile.

36Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke fọduru n'ulo-gi gābia ikpọ isi ala nye ya n'ihi ego ntà nke ọla-ọcha na ob͕e achicha, ọ gāsi kwa, Biko, tiyem n'otù uzọ ọlu-nchu-àjà, ka m'we rie iberibe achicha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help