ABÙ ỌMA 56 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Jonath elem rehokim. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ndi Filistia jidere ya na Gat.

1Merem amara, Chineke; n'ihi na madu ekusiwo ume ike ilom:

Ogologo ubọchi nile ka o nēbu agha nēmeb͕um.

2Ndi nēchem anwu nēkusi ume ike ilom ogologo ubọchi nile:

N'ihi na ha bara uba bú ndi nēbu agha imegidem n'ibuli onwe-ha elu.

3N'ubọchi m'nātu egwu,

Mu onwem, ọ bu Gi ka m'gātukwasi obi.

4Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya:

Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu;

Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?

5Ogologo ubọchi nile ka ha nāhighari okwum nile:

N'imegidem èchìchè nile ha bu ime ihe ọjọ.

6Ha nēzukọ, nēzobe onwe-ha,

Ndi ahu nēlezi ikiri-ukwum abua anya,

Dika ha leworo anya nkpuru-obim.

7Ọ̀ bu n'ihi ajọ ihe ka ha nāb͕apu?

N'iwu-Gi me ka ndi nile di iche iche rida, Chineke.

8Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu:

Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi;

Hà adighi n'akwukwọ-Gi:

9Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi:

Nka ka m'mara, na Chineke dirim.

10Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya:

Nime Jehova ka m'gēto okwu-Ya.

11Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu;

Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?

12N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di:

M'gākwughachi Gi ekele nile.

13N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu:

Ì naputaghi ukwum abua na nnuda anēnudam?

Ka m'we nējeghari n'iru Chineke

N'ihè ndi ndu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help