ZEKARAIA 7 - Bible Lgbo

1O rue, n'arọ nke-anọ nke Daraiọs, bú eze, na okwu Jehova ruru Zekaraia nti, n'ubọchi nke-anọ nke ọnwa nke-iteghete, n'ọnwa Kislev.

2Ma ndi Bet-el zigarari Shareza na Regem-melek na ndi-ha ime ka iru Jehova dajua,

3na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M'gākwa ákwá n'ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m'meworo otutu aro ra ka ndia?

4Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,

5Gwa ndi nile nke ala nka, gwa kwa ndi-nchu-àjà, okwu, si, Mb͕e unu buru ọnu, mb͕e unu tiri aka n'obi n'ọnwa nke-ise, na n'ọnwa nke-asa, ọbuná ọgu arọ atọ na iri ndia, ọ̀ bu obubu-ọnu unu buru ma-ọli nye Mu onwem?

6Ọzọ, mb͕e unu nēri ihe, ma-ọbu mb͕e unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ọ̀ bughi unu onwe-unu bu ndi nēri ihe? ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu bu ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu?

7Ùnu agaghi-anu okwu nile nke Jehova kpọsaworo site n'aka ndi-amuma mbu, mb͕e Jerusalem bu ebe madu bi, mb͕e ọ nọ kwa n'udo, mb͕e madu bi kwa n'obodo-ya nile di ya buruburu na nime Negeb na n'ebe di ala ala?

8Okwu Jehova we rue Zekaraia nti, si,

9Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya:

10unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.

11Ha we ju iṅa nti, wezuga ubu-ha, me ka nti-ha di arọ́, ka ha we ghara inu ihe.

12Ọ bu kwa obi-ha ka ha mere ka ha ghọ nkume adamant, ka ha we ghara inuru iwu Chineke, na okwu nile nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha zitere site na Mọ-Ya site n'aka ndi-amuma mbu: oké iwe we site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha bia.

13O rue na, dika Ọ kpọrọ òkù, ma ha anughi; otú a ka ha gākpọ òkù, ma M'gaghi-anu; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri;

14ma M'gēfesa ha dika oké ifufe n'etiti mba nile ndi ha nāmaghi. Ala nka we tọb͕ọrọ n'efu n'azu ha, ghara inwe onye-ngabiga ma-ọbu onye nālata: n'ihi na ha mere ala anāchọsi ike ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help