JOB 8 - Bible Lgbo

1Bildad, bú onye Shua, we za, si,

2Rùe ole mb͕e ka i ganēkwu ihe ndia?

Rù kwa ole mb͕e ka okwu nile nke ọnu-gi gābu ifufe di ike?

3Chineke, Ọ̀ neme ka ikpé b͕agọ ab͕agọ?

Ma-ọbu Onye Nke puru ime ihe nile,

Ọ̀ nēme ka ezi omume b͕agọ ab͕agọ?

4Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya,

Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha:

5Ọ buru na gi onwe-gi achọsie Chineke ike,

We riọ Onye Nke puru ime ihe nile aririọ-amara;

6Ọ buru na onye di ọcha n'obi na onye ziri ezi ka i bu;

N'ezie ub͕u a Ọ gētetara gi,

Me ka ebe-obibi nke ezi omume-gi di n'udo.

7Ọ bu ezie na nmalite-gi di ntà,

Ma ikpe-azu-gi gēbù ibù nke-uku.

8N'ihi na, biko, jua ọb͕o mbu,

Dozie onwe-gi imata ihe ndi bu nna-ha gwuputara:

9(N'ihi na nke nnyahuru ka ayi bu, ayi amaghi kwa ihe,

N'ihi na onyinyo ka ubọchi-ayi nile bu n'elu uwa:)

10Ndi ahu, hà agaghi-ezí gi ihe, gwa gi okwu,

Si n'obi-ha weputa okwu?

11Papyrus, Ò gētolite elu ma apiti adighi?

Amì, ò gēbù ibù ma miri adighi?

12Mb͕e ọ nọ n'ima akwukwọ ndu, mb͕e akēbighi ya,

Ọ nēbu ahihia ọ bula uzọ akpọnwu.

13Otú a ka okporo-uzọ ndi nile nēchezọ Chineke si di;

Olile-anya nke onye emeruru emeru gāla n'iyì:

14Onye agākpaji okwukwe efu ya,

Ntukwasi-obi-ya bu kwa ulo ududo.

15Ọ gādabere n'aru ulo-ya, ma ọ gaghi-eguzo:

Ọ gējide ya, ma ọ gaghi-eguzosi ike.

16Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu,

Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.

17Nkpọrọgwu-ya nēkekọta onwe-ha n'aru obo nkume,

Ọ nāhu ebe nkume anya.

18Ọ buru na esi n'ebe-ya loda ya,

Ọ gāgọnari kwa ya, si, Ahughm i.

19Le, nka bu obi-utọ, nke uzọ-ya,

Ma ndi ọzọ gēsi n'ájá pue.

20Le, Chineke agaghi-aju onye zuru okè,

Ọ gaghi-ejide kwa aka ndi nēme ihe ọjọ.

21Rue mb͕e Ọ gēwere ichì-ọchì mejue ọnu-gi,

Were kwa iti-nkpu mejue eb͕ub͕ere-ọnu-gi.

22Ndi nākpọ gi asì gēyi ihere dika uwe;

Ulo-ikwū nke ndi nēmebi iwu agaghi-adi kwa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help