JEREMAIA 2 - Bible Lgbo

1Okwu Jehova we ruem nti, si,

2Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.

3Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

4Nurunu okwu Jehova, unu ulo Jekob, na ab͕uru nile nke ulo Israel:

5otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?

6Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu?

7M'we me ka unu bata n'ala nke ubi ọma, iri nkpuru-ya na ezi ihe-ya: unu we bata, we merua alam, me ka ihe-nketam ghọ ihe-árú.

8Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro.

9N'ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe.

10N'ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo.

11Ọ̀ di mba ab͕anweworo chi di iche iche ha, ọ bu ezie na ihe ahu abughi chi? ma ndim ab͕anwewo nsọpuru-ha n'ihe nadighi-abà urù.

12Ka ibodo ihe a nwu a unu n'aru, unu elu-igwe, tuanu oké ujọ, burunu ihe tọb͕ọrọ n'efu nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

13N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.

14Israel, ọ̀ bu orù? ọ̀ bu orù amuru n'ulo ka ọ bu? gini mere o ji ghọ ihe-nluta-n'agha?

15Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.

16Ọzọ, umu Nof na Tahpanhes nērichapu opu-n'isi-gi.

17Ọ̀ bughi nka ka i nēmere onwe-gi, n'irapu Jehova, bú Chineke-gi, mb͕e Ọ nēme ka i je ije n'uzọ?

18Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu?

19Ihe ọjọ gi gādọ gi aka na nti, ndaghachi-azu-gi nile gāba-kwa-ra gi nba: ya mere mara, hu na ihe ọjọ na ihe di ilu ka ọ bu, na i rapuworo Jehova, bú Chineke-gi, oké egwum we ghara idi n'aru gi, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

20N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M'b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M'gaghi-efè òfùfè; n'ihi na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu nan'okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.

21Ma Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bu nání ihe ziri ezi: ì si kwa aṅa b͕anwe orù osisi vine nke ala ọzọ n'ebe M'nọ?

22N'ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n'onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n'irum, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

23Ì gēsi aṅa si, Arughm árú, ejesoghm Bealim? le uzọ-gi na ndagwurugwu, mara ihe i meworo: i bu nwa-ab͕ọghọ-camel di nkọ nāb͕aghari n'uzọ-ya nile;

24i bu nne-inyinya-ibu-ọhia nke mara ọzara aka; n'ọchichọ nke nkpuru-obi-ya o kubawo ifufe; na mb͕e ọbub͕a-ya ònye gēme ka ọ laghachi azu? ndi nile nke nāchọ ya agaghi-ada #mbà; n'ọnwa-ya ka ha gāchọta ya.

25B͕ochie ukwu-gi n'ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n'ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n'ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n'anya, ha ka m'gējeso kwa.

26Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha;

27ndi nāsi osisi, Nnam ka i bu; nāsi kwa nkume, Gi onwe-gi murum: n'ihi na ha ab͕akutawom azu, ha echeghm iru: ma na mb͕e ọnọdu ọjọ ha ha gasi, Bilie, we zọputa ayi.

28Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n'ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda.

29N'ìhi gini ka unu nārusom uka? unu nile ejehiewo megidem, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

30N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.

31Unu ọb͕ọ a, unu onwe-unu le Jehova. Ọ̀ bu ọzara ka M'buworo Israel? ma-ọ̀bu ala nke oké ọchichiri? gini mere ndim ji si, Ayi lupuru alupu; ayi agaghi-abiakute Gi ọzọ?

32Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ọ̀ gēchezọ ihe-ichọ-nma-ya? nwayi aluru ọchu, ọ̀ gēchozọ ihe ike n'úkwù-ya? ma ndim echezọwom ubọchi nādighi ọnu-ọgugu.

33Gini mere i ji eme ka uzọ-gi di nma ichọ ihu-n'anya? n'ihi ya ọbuná ndinyom ọjọ ka i zíworo uzọ-gi nile.

34Ọzọ, n'ọnu-ọnu-uwe-gi ka achọtaworo ọbara nke nkpuru-obi nke ndi-ob͕eye nēmeghi ihe ọjọ: ọ bughi na ntipú-ulo ka i chọtara ha, kama ọ bu n'ihi ihe ndia nile.

35Ma i siri, Emeghm ihe ọjọ; n'ezie iwe-Ya esiwo n'arum laghachi. Le, Mu na i ganēje n'ikpé, n'ihi na i siri, Emehieghm.

36Gini mere i ji kpaghari nke-uku ib͕anwe uzọ-gi? ihere Ijipt gēme kwa gi, dika ihere Asiria mere gi.

37Ọbuná n'ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n'isi-gi: n'ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help