ILU 4 - Bible Lgbo

1Umum, nurunu idọ-aka-na-ntí nke nna,

Tọ-kwa-nu nti n'ala ima nghọta:

2N'ihi na ezi ihe-nmuta ka m'nyeworo unu;

Unu arapula iwum.

3N'ihi na nwa ka m'buru nnam,

Di nrò, buru kwa nwa enwere nání ya n'iru nnem.

4O we zím ihe, sim,

Ka obi-gi jide okwum nile;

Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu:

5Nweta amam-ihe, nweta nghọta;

Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi:

6Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi;

Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi.

7Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe:

E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.

8Tukọba ya elu, o gēbuli kwa gi:

Ọ gāsọpuru gi, mb͕e i nāb͕aku ya obi.

9Ọ gēnye isi-gi okpu amara:

Okpu-eze mara nma ka ọ gēnye gi n'aka.

10Nuru, nwam, nara kwa okwu-ọnum nile;

Arọ ndu gāba-kwa-ra gi uba.

11N'uzọ amam-ihe ka m'zíworo gi ihe;

Emewom ka i zọ ije n'uzọ nile nke izi-ezi.

12Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi;

Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ.

13Jide idọ-aka-na-nti aka; arala ya aka:

Chebe ya; n'ihi na ya onwe-ya bu ndu-gi.

14Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu,

Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ.

15Zere ya, agabigala nime ya;

Wezugara ya onwe-gi, gabiga.

16N'ihi na ha adighi-araru ura, ọ buru na ha adighi-eme ihe ọjọ;

Anapuwo kwa ura-ha n'ike, ọ buru na ha adighi-eme ka madu su ngọngọ.

17N'ihi na ha eriwo nri nke nmebi-iwu,

Ọ bu kwa manya nke ihe-ike ka ha nāṅu.

18Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu,

Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.

19Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri:

Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.

20Nwam, ṅa nti n'okwum nile;

Tọ nti-gi n'ala n'okwu-ọnum nile.

21Ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;

Debe ha n'etiti obi-gi.

22N'ihi na ndu ka ha buru ndi nachọta ha,

Ha bu kwa ihe nāgwọ anu-aru-ha nile.

23Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi;

N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.

24Si n'ebe i nọ wezuga ọnu nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ,

Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuhie ekwuhie di anya n'ebe i nọ.

25Ka anya-gi abua legide n'iru,

Ka mbubere-anya-gi lezi kwa n'iru gi.

26Me ka okporo-uzọ nke ukwu-gi abua di lari,

Ka edozi kwa uzọ-gi nile.

27Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe:

Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help