ABÙ ỌMA 94 - Bible Lgbo

1Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova,

Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.

2Bulie Onwe-gi, Onye-ikpe nke uwa:

Nyeghachi ndi-npako nmeso-ha.

3Jehova, rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu,

Rùe ole mb͕e ka ndi nēmebi iwu gāṅuri ọṅu-agha?

4Ha nēkwuwa okwu-ọnu, ha nēkwu oké okwu:

Ndi nile nke nālu ajọ ihe nānya isi.

5Ndi-Gi ka ha nāzọpia, Jehova,

Ọ bu kwa ihe-nketa-Gi ka ha nēweda n'ala.

6Ha nēb͕u nwanyi di-ya nwuru, na ọbìa,

Ha nēb͕u kwa umu-nb͕ei n'ọchu.

7Ha we si, Ja agaghi-ahu,

Chineke nke Jekob agaghi-amata kwa.

8Ghọtanu, unu ndi bu anu-ọhia n'etiti ndi Israel:

Unu ndi-nzuzu kwa, òle mb͕e unu gēnwe uche?

9Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe?

Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?

10Onye nādọ mba nile aka na nti, Ọ̀ gaghi-aba nba,

Bú Onye nēzí madu ihe-ọmuma?

11Jehova mara èchìchè madu,

Na èchìchè ahu bu nání otù nku-ume.

12Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke I nādọ aka na nti, Ja,

Onye I nēsi kwa n'iwu-Gi zí ihe;

13Ime ka ọ nọ jū pua n'ubọchi nile nke ihe ọjọ,

Rue mb͕e agēgwuru onye nēmebi iwu olùlù.

14N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka,

Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.

15N'ihi na ikpé gālaghachikute ezi omume:

Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gēso kwa ya.

16Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ?

Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?

17Ọ buru na Jehova abughi onye nēyerem aka,

Ọ fọduru nwa mb͕e nkpuru-obim gēbiwori n'ebe inọ-dū.

18Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya;

Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.

19Mb͕e ncheb͕um nāba uba n'imem,

Nkasi-obi-Gi nile nāgugu nkpuru-obim.

20Àgējikọta Gi na oche-eze nke ihe-ila-n'iyì nile,

Nke nēji ukpuru kpuzí nmeb͕u?

21Ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe imegide nkpuru-obi onye ezi omume,

Ọ bu kwa ọbara nēmeghi ihe ọjọ ka ha nāma ikpe.

22Ma Jehova aburuworom ulo-elu;

Chinekem bu kwa oké nkume nke ebe-nb͕abàm.

23O mewo kwa ka ajọ ihe-ha laghachikute ha,

Ọ bu kwa ihe ọjọ ha ka Ọ gēji kpochapu ha;

Jehova, bú Chineke-ayi, gēkpochapu ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help