ABÙ ỌMA 96 - Bible Lgbo

1Bùkuenu Jehova abù ọhu:

Bùkuenu Jehova abù, unu uwa nile.

2Bùkuenu Jehova abù, gọzienu aha-Ya;

Nēzisanu ozi nzọputa-Ya site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ.

3Kọsanu akukọ ebube-Ya n'etiti mba nile,

Akukọ oké ọlu-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

4N'ihi na Jehova di uku, buru kwa onye anēto nke-uku:

Onye anātu egwu Ya ka Ọ bu n'elu chi nile.

5N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu:

Ma Jehova mere elu-igwe.

6Ebube na ima-nma di n'iru Ya:

Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.

7Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,

Nyenu Jehova nsọpuru na ike.

8Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:

Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n'ogige-Ya nile.

9Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ:

Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile.

10Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze:

Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya:

Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.

11Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;

Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;

12Ka ọhia ṅuria ọṅu-agha, ya na ihe nile nke di nime ya;

Mb͕e ahu osisi nile nke oké ọhia gēti nkpu ọṅù;

13N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo;

N'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe:

Ọ gēji ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe,

Ọ gēji kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Ya kpe ndi nile di iche iche ikpe.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help