ILU 2 - Bible Lgbo

1Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,

Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;

2Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala,

We wezuga obi-gi inwe nghọta;

3E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,

Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;

4Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,

Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:

5Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,

Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.

6N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe;

N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:

7O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,

Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;

8Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,

Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.

9Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,

Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.

10N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,

Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;

11Ìzùzù ganēche gi nche,

Nghọta gēchebe gi:

12Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,

N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;

13Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,

Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;

14Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,

Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;

15Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,

Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:

16Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,

N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;

17Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,

Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:

18N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,

Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.

19Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata,

Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:

20Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma,

Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.

21N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa,

Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.

22Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa,

Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help