ỌPUPU 21 - Bible Lgbo

1Ma ndia bu ikpé nke i gētiye n'iru ha.

2Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n'arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n'efu.

3Ọ buru na ọ bata nání ya, ọ gāpu nání ya: ọ buru na onye nwere nwunye ka ọ bu, nwunye-ya gēso kwa ya pua.

4Ọ buru na onye-nwe-ya enye ya nwunye, nwayi ahu ewe muara ya umu-ndikom ma-ọbu umu-ndinyom; nwayi ahu na umu-ya gābu ihe onye-nwe-ya nwere, ma ọ gapu nání ya.

5Ma ọ buru na orù ahu asi n'ezie, Ahurum onye-nwem na nwunyem na umum n'anya; m'gaghi-apu nwere onwem:

6onye-nwe-ya gēme kwa ka ọ biakute Chineke nso, ọ gēme kwa ka ọ biarue nso ọnu-uzọ, ma-ọbu nso awara-uzọ; onye-nwe-ya gēwere arà rapue nti-ya; ọ gābu kwa orù-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

7Ma mb͕e nwoke gēre nwa-ya nwayi ka ọ buru orù-nwayi, ọ gaghi-apu dika ọpupu orù-ndikom.

8Ọ buru na ọ jọ njọ n'anya onye-nwe-ya, bú onye kwere na ya onwe-ya gālu ya na nwunye, ọ gēkwe kwa ka ab͕aputa ya: ọ gaghi-enwe ike ire ya nye ndi ala ọzọ, n'ihi na ọ ghọb͕uru ya.

9Ma ọ buru na ọ kwere na nwa-ya nwoke gālu ya, dika ihe ekpere n'ikpe bayere umu-ndinyom si di, otú a ka ọ gēme ya.

10Ọ buru na ọ lutara ya nwunye ọzọ; ọ gaghi-ewebì anu-oriri-ya, na ihe-nb͕okwasi-ya, na ihe kwesiri ya dika nwunye.

11Ma ọ buru na ọ meghi ihe atọ ndia nye ya, ọ gāpu kwa n'efu, nēnyeghi ego.

12Onye nētib͕u madu, ọ we nwua, aghaghi ime ka ọ nwua.

13Ma onye nēcheghi anwu, ma Chineke mere ka ọ dabà n'aka-ya; M'gēdoro gi ebe ọ gāb͕alaga.

14Ma mb͕e onye ọ bula gēwere nganga biakwasi ibe-ya, ib͕u ya n'aghughọ; n'ebe-ichu-àjàm ka i gēwepu ya ka ọ nwua.

15Onye nēti nna-ya, ma-ọbu nne-ya, ihe, aghaghi ime ka ọ nwua.

16Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.

17Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.

18Mb͕e ndikom nēse okwu, ma otù nime ha ewere nkume ma-ọbu iwere ọkpọ ti ibe-ya, ma ọ nwughi, ma o dina n'ihe-ndina ọria:

19ma ọ buru na o bilie, jeghari n'èzí, dabere na nkpa-n'aka-ya, agāgu onye tiri ya n'onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma.

20Mb͕e onye ọ bula gēwere nkpa-n'aka ti orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ọ we nwua n'okpuru aka-ya; aghaghi ibọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya.

21Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya: n'ihi na ego-ya ka ọ bu.

22Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n'aka ndi-ikpé.

23Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu,

24anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,

25ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.

26Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya.

27Ọ buru kwa na ọ me ka ezé orù-ya nwoke ma-ọbu ezé orù-ya nwayi dapu; ọ gēzipu kwa ya ka o nwere onwe-ya n'ihi ezé-ya.

28Mb͕e ehi gāsọ nwoke ma-ọbu nwayi mpì, o we nwua, aghaghi itub͕u ehi ahu na nkume, agaghi-eri kwa anu-ya; ma agāgu onye-nwe ehi ahu n'onye ikpe nāmaghi.

29Ma ọ buru na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ewe b͕ara onye-nwe-ya àmà, ma o debeghi ya nke-ọma, kama o mere ka nwoke ma-ọbu nwayi nwua; agātub͕u ehi ahu na nkume, ọzọ kwa, agēme ka onye-nwe-ya nwua.

30Ọ buru na ihe ikpuchi nmehie-ya ka agātukwasi ya, ọ gēnye ihe-nb͕aputa nke ndu-ya, dika ihe nile agātukwasi ya si di.

31Ma ọ bu nwa-nwoke ka ọ sọrọ mpì, ma ọ bu nwa-nwayi ka ọ sọrọ mpì, dika ikpé a si di ka agēme ya.

32Ọ buru na orù-nwoke ma-ọbu orù-nwayi ka ehi ahu sọrọ mpì; orú shekel ọla-ọcha na iri ka ọ gēnye onye-nwe-ya, agātub͕u kwa ehi ahu.

33Mb͕e onye ọ bula gēmeghe olùlù, ma-ọbu mb͕e onye ọ bula gēgwu olùlù, ghara imechi ya, ehi ma-ọbu inyinya-ibu ewe dabà nime ya,

34onye-nwe olùlù ahu gākwughachi ihe; ego ka ọ gēnyeghachi onye-nwe-ya, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.

35Mb͕e ehi onye ọ bula gēmeru ehi nke madu-ibe-ya aru, ọ we nwua; ha gēre kwa ehi di ndu, kè ego-ya: ọzọ kwa, nke nwuru anwu ka ha gēkè.

36Ma-ọbu asi na amara na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ma onye-nwe-ya edebeghi ya nke-ọma; ọ ghaghi ikwughachi ehi n'ọnọdu ehi ahu, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help