NKPUGHE 3 - Bible Lgbo

1Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Sadis akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nwere Mọ asa ahu nke Chineke, na kpakpando asa ahu: Amataram, ọlu-gi nile, na i nwere aha na i di ndu, ma i bu onye nwuru anwu.

2Ghọ onye nēche nche, me kwa ka ihe fọduru guzosie ike, bú nke gaje inwu anwu: n'ihi na ọ dighi ọlu-gi M'huworo nke zuworo ezù n'iru Chinekem.

3Ya mere, nēcheta otú i nataworo, ya na otú i nuru; nēdebe kwa ya, chèghari kwa. Ya mere, asi na i cheghi nche, M'gābia dika onye-ori, i gaghi-amara kwa oge hour M'gābiakwasi gi ma-ọli.

4Ma i nwere aha ole-na-ole na Sadis ndi nēmerughi uwe-ha: ha gēsokam nējeghari nime uwe ọcha; n'ihi na ha bu ndi kwesiri.

5Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M'gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M'gēkwuputa kwa aha-ya n'iru Nnam, na n'iru ndi-mọ-ozi-Ya.

6Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

7Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Filadelfia akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye di Nsọ, Onye-ezi-okwu, Onye nwere nkpisi-ugodi nke Devid, Onye nēmeghe, ọ dighi kwa onye ọ bula gēmechi, Onye nēmechi kwa, ọ dighi kwa onye ọ bula nēmeghe:

8Amataram ọlu-gi nile (le, enyewom gi ọnu-uzọ nke emegheworo n'iru gi, nke onye ọ bula nāpughi imechi), na i nwere ike ntà, i debe-kwa-ra okwum, i gọnarighi kwa aham.

9Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya.

10N'ihi na i debere okwu nke ntachi-obim, Mu onwem gēdebe kwa gi ka i ghara ibà n'oge hour nke ọnwunwa ahu, bú oge hour nke gaje ibiakwasi elu-uwa dum madu bi, inwa ndi bi n'elu uwa.

11Anamabia ọsọsọ: jidesie ihe i nwere ike, ka onye ọ bula ghara inara ọkpu-eze-gi.

12Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēme ka ọ buru ide n'ulo nsọ nke Chinekem, ọ gaghi-esi kwa n'ebe ahu pua ọzọ ma-ọli: M'gēde-kwasi kwa ya aha Chinekem, na aha obodo Chinekem, bú Jerusalem ọhu, nke si n'elu-igwe ridata site n'ebe Chinekem nọ, M'gēdekwasi kwa ya aha ọhu nkem.

13Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

14Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si,

Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:

15Amataram ọlu-gi nile, na i jughi oyi i kpoghi kwa ọku: ọ gādi m nọ̄ nma ma i nāju oyi ma-ọbu na i nēkpo ọku.

16Otú a, n'ihi na i di ṅaraṅara, i kpoghi kwa ọku i jughi kwa oyi, M'gāb͕ọpu gi n'ọnum.

17N'ihi na i nāsi, Abum ọgaranya. emewo ka m'buru ọgaranya, ọ dighi kwa ihe ọ bula nākpam; i mataghi kwa na gi onwe-gi bu onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ob͕eye na onye kpuru ìsì na onye nāb͕a ọtọ:

18aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.

19Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.

20Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.

21Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o som nọdu ala n'oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n'oche-eze-Ya.

22Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help