AISAIA 48 - Bible Lgbo

1Nurunu nka, unu ulo Jekob, ndi anākpọ n'aha Israel, ndi siwo-kwa-ra na miri Juda puta; ndi ji aha Jehova aṅu iyi, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha nēhota, ma ọ bughi n'ezi-okwu, ọ bughi kwa n'ezi omume.

2N'ihi na ha akpọwo onwe-ha ndi sitere n'obodo nsọ, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha dabereworo; Jehova usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

3Ihe mbu nile site na mb͕e ochie ka M'gosiworo; ọ bu kwa n'ọnum ka ha siri puta, M'we meka anu ha: na mberede ka M'mere ha, ha we me.

4N'ihi na M'mara na onye siri ike ka i bu, na ọ bu akwara ígwè ka olu-gi bu, na egedege-iru-gi bu kwa ọla;

5M'we gosi gi ya site na mb͕e ochie; tutu o me emerem ka i nuru: ka i we ghara isi, Arusim emewo ha, ọ bu kwa arusim apiri api na arusim awuru awu nyere ha iwu.

6I nuwo ya; gi le ihe a nile; unu onwe-unu kwa, ùnu agaghi-egosi ya? Emewom ka i nuru ihe ọhu di iche site n'ub͕u a, bú ihe echebeworo na nzuzo, nke i nāmaghi.

7Ub͕u a ka ekèworo ha, ọ bughi site na mb͕e ochie; ọzọ, tutu ubọchi ta erue i nughi kwa ha;ka i we ghara isi, Le, amaram ha.

8Otú ọ di, i nughi; i maghi kwa; site kwa na mb͕e ochie nti-gi egheghi oghe: n'ihi na amaram na i nāghọb͕u nke-uku, ọzọ, Onye nējehie ejehie site n'afọ nne-ya, ka anākpọ gi.

9N'ihi aham ka M'nēme ka iwem nọ ọdù, ọ bu kwa n'ihi otutom ka M'nēb͕ochi ya n'ebe i nọ, ka M'we ghara ibipu gi.

10Le, anuchawom i, ma ọ bughi dika ọla-ọcha; arọputawom i n'oké ọku nke iweda-n'ala.

11N'ihi Mu onwem, n'ihi Mu onwem, ka M'gēme ya; n'ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum.

12Gem nti, Jekob, na Israel, bú onye M'kpọworo: Mu onwem bu Onye ahu; Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu.

13E, akam atọwo ntọ-ala uwa, ọ bu kwa aka-nrim setipuworo elu-igwe: ọ buru na Mu onwem akpọ ha gēguzo ọtọ n'otù.

14Chikọtanu onwe-unu, unu nile, nuru kwa; ònye n'etiti ha gosiworo ihe ndia? Onye ahu Jehova huworo n'anya gēme ihe nātọ Ya utọ na Babilon, ọ bu kwa ogwe-aka-ya gādakwasi ndi Kaldea.

15Mu onwem, ọbuná Mu onwem, ekwuwo okwu; e, akpọwom ya: emewom ka ọ bia, ọ gēme kwa ka ije-ya ga nke-ọma.

16Biakutenum nso, nurunu nka; site na mb͕e mbu ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu; site na mb͕e ọdidi-ya, n'ebe ahu ka M'nọ: ma ub͕u a Onye-nwe-ayi Jehova ezitewom, mu na Mọ-Ya.

17Otú a ka Jehova siri, bú Onye-nb͕aputa-gi na Onye Nsọ Israel: Mu onwem bu Jehova, Chineke-gi, Onye nēzí gi ime ihe nābà úrù, Onye nēme ka i zọ ije n'uzọ i gējeso.

18Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na i ṅarari nti n'ihe nile M'nyere n'iwu! udo-gi ewe diwori ka osimiri, ezi omume-gi adi kwa ka nmali-miri nile nke oké osimiri:

19nkpuru-gi gādiwo-kwa-ri ka ájá, umu nke si n'afọ-gi puta di ka umu-ihe si n'afọ oké osimiri ahu puta: agaghi-ebipuwori aha-ya ma-ọbu kpochapu ya n'irum.

20Sinu na Babilon pua, b͕anarinu ndi Kaldea; werenu olu nke iti-nkpu-ọṅù gosi, me ka anuru nka, menu ka ọ puta ìhè rue nsọtu uwa: sinu, Jehova ab͕aputawo orù-Ya, bú Jekob.

21Akpiri akpọghi ha nku mb͕e O mere ka ha je ije n'ala kpọrọ nku: O mere ka miri si n'oké nkume rùputara ha: e, Ọ kpọwara oké nkume, miri we suputa.

22Ọ dighi udo diri ndi nēmebi iwu, ka Jehova siri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help