ABÙ ỌMA 91 - Bible Lgbo

1Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu,

Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

2M'gāsi Jehova, I bu ebe-nb͕abàm na ebem ewusiri ike;

I bu Chinekem, Onye m'nātukwasi obi.

3N'ihi na Ya onye-ya gānaputa gi n'ib͕udu nke osi-ọnyà,

Na n'aka ajọ ọria nēfe efe nke nēweta ila-n'iyì.

4Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi,

Ọ bu kwa n'okpuru nkù-Ya abua ka i gāb͕àba:

Ọta uku na ọta di buruburu ka ezi-okwu-Ya bu.

5I gaghi-atu egwu site n'oké egwu nke abali,

Ma-ọbu site n'àkú nke nēfeghari n'ehihie;

6Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri,

Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.

7Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi;

Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi;

Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.

8Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide,

We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.

9N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm;

N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;

10Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi,

Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.

11N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi,

Idebe gi n'uzọ-gi nile.

12N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi,

Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.

13Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu:

I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.

14N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa:

M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham.

15Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya;

Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu:

M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya.

16Ubọchi ndu di ogologo ka M'gēji me ka afọ ju ya,

M'gēme kwa ka o lekwasi nzọputam anya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help