II. IHE EMERE 22 - Bible Lgbo

1Ndi bi na Jerusalem we me Ehazaia nwa-ya nke-ntà eze n'ọnọdu ya: n'ihi na usu ndi nāpunara madu ihe, bú ndi soro ndi Arebia ba n'ọmuma-ulo-ikwū, b͕uru ndi nile bu ya okenye. Ehazaia nwa Jehoram, bú eze Juda, we buru eze.

2Ọgu arọ abua na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem: ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri.

3Ya onwe-ya je-kwa-ra ije n'uzọ nile nke ulo Ehab: n'ihi na nne-ya bu onye nādu ya ọdu imebi iwu.

4O we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ndi ahu buru ya ndi nādu ọdu mb͕e ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi.

5O jeghari-kwa-ra n'idu-ọdu-ha, we soro Jehoram nwa Ehab, bú eze Israel, ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram.

6O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.

7Ma o sitere na Chineke, bú nzọda Ehazaia, n'ibiakute Joram: n'ihi na mb͕e ọ biara, o we so Jehoram pukuru Jihu nwa Nimshi, onye Jehova tere manu ibipu ulo Ehab.

8O rue, mb͕e Jihu nēme ulo Ehab ihe ekpere n'ikpe, na ọ huru ndi-isi Juda, na umu-ndikom nke umu-nne Ehazaia, ndi nējere Ehazaia ozi, o we b͕ue ha.

9O we chọ Ehazaia, ha we jide ya, (ma onye ahu nēzo onwe-ya nime Sameria,) ha we me ka ọ biakute Jihu, me ka ọ nwua; ha we lìe ya, n'ihi na ha siri, Nwa Jehoshafat ka ọ bu, onye were obi-ya nile chọ Jehova. Ma ulo Ehazaia enweghi onye nwere ike ijide ala-eze.

10Mb͕e Atalaia, bú nne Ehazaia, huru na nwa-ya nwoke anwuwo, o bilie, me ka nkpuru nile la n'iyì, bú ndi nwe ala-eze ulo Juda.

11Ma Jehoshabeat, bú nwa-nwayi eze, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina. Jehoshabeat nwa-nwayi eze, bú Jehoram, nwunye Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, (n'ihi na nwayi ahu bu nwa-nne Ehazaia,) we zopu ya n'iru Atalaia, o we ghara ime ka ọ nwua.

12O we nọ n'aka-ha n'ulo Chineke nēzo onwe-ya arọ isi: Atalaia we buru eze ala ahu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help