ABÙ ỌMA 143 - Bible Lgbo

Abù Ọma Devid.

1Jehova, nuru ekperem; ṅa nti n'aririọ-amaram nile:

N'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi zam, na n'ezi omume-Gi.

2Eji-kwa-la orù-Gi ba n'ikpé;

N'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke di ndu bu onye ezi omume n'iru Gi.

3N'ihi na onye-iro esob͕uwo nkpuru-obim;

Ọ zọpiawo ndum n'ala:

O mewom ka m'biri n'ebe di iche iche b͕ara ọchichri, dika ndi nwuru anwu site na mb͕e ebighi-ebi.

4Mọm we ghara inwe ike nimem;

Ibobo nānwu obim nimem.

5Echetawom ubọchi nile nke mb͕e ochie;

Atughariwom uche n'omume-Gi nile:

N'ọlu aka-Gi abua ka m'tughariworo obi.

6Ab͕asawom akam abua n'ebe I nọ:

Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n'ebe I nọ. Selah

7Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo:

Ezonarilam iru-Gi;

Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.

8Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu;

N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi:

Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya;

N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.

9Naputam n'aka ndi-irom, Jehova:

N'ebe I nọ ka m'kpuchiworo onwem.

10Zím ime ihe di Gi utọ; n'ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem:

Mọ-Gi di nma; durum n'ala di lari.

11N'ihi aha-Gi, Jehova, me ka m'di ndu:

N'ezi omume-Gi me ka nkpuru-obim puta n'ahuhu.

12Ọzọ, n'ebere-Gi kpochapu ndi-irom,

Me kwa ka ndi nile ndi nākpab͕u nkpuru-obim la n'iyì;

N'ihi na mu onwem bu orù-Gi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help