HAGAI 1 - Bible Lgbo

1N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,

2Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Ndi nka siri, Oge ibia erughi, bú oge iwu ulo Jehova.

3Okwu Jehova we si n'aka Hagai, bú onye-amuma, bia, si,

4Ọ̀ bu oge unu nwere, unu onwe-unu, ibi n'ulo-unu amachitara osisi, mb͕e ulo a bu nkpọnkpọ ebe?

5Ma ub͕u a, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n'uzọ nile unu.

6Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n'akpa puru epu.

7Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n'uzọ nile unu.

8Rigonu n'ugwu, bute osisi, wue ulo a, ọ gātọkwam utọ, agāsọpu-kwa-ram, ka Jehova siri.

9Unu lere anya ihe bara uba, ma, le, ọ ghọrọ ihe ntà; mb͕e unu bulatara ya ulo, M'we fùsasia ya, N'ìhi gini? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta). N'ihi ulom, nke bu nkpọnkpọ ebe; ma unu onwe-unu nāb͕a ọsọ, onye ọ bula ọ b͕akuru ulo nke aka ya.

10N'ihi nka ka elu-igwe nke di n'elu unu b͕ochiworo igirigi, ala eb͕ochiwo kwa ihe-omume-ya.

11M'we kpọ oge ọkpukpọ-nku ka ọ dakwasi ala nka na ugwu-ya nile na ọka-ya na manya-vine ọhu ya na manu ọhu ya na ihe nile nke ala nēpuputa na madu na anumanu na ihe nile unu dọb͕uru onwe-unu n'ọlu inweta.

12Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi Israel nile fọduru, we ge nti olu Jehova, bú Chineke-ha, ge kwa nti okwu nile nke Hagai, bú onye-amuma, dika Jehova, bú Chineke-ha, zitere ya; ndi Israel we tua egwu n'iru Jehova.

13Hagai, bú onye-ozi Jehova, we gwa ndi Israel okwu n'ozi Jehova, si, Mu onwem nọyere unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

14Jehova we kpọte mọ Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, na mọ Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, na mọ nke ndi Israel nile fọduru; ha we bia je ozi n'ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke-ha,

15n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, n'ọnwa nke-isi, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help