JỌN 2 - Bible Lgbo

1N'ubọchi nke-atọ ọlulu-nwunye di na Kena nke Galili; nne Jisus nọ kwa n'ebe ahu:

2ewe kpọ kwa Jisus, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, bia n'ọlulu-nwunye ahu.

3Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine.

4Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi.

5Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya.

6Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù.

7Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu.

8O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya.

9Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu,

10si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a.

11Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.

12Mb͕e ihe a gasiri Ọ ridara na Kapanaum, Ya onwe-ya, na nne-Ya, na umu-nne-Ya, na ndi nēso uzọ-Ya: ha we nọgide n'ebe ahu ọ bughi ọtutu ubọchi.

13Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem.

14Ọ we hu n'ulo uku Chineke ndi nēre ehi na aturu na nduru, na ndi nāb͕anwe ego ka ha nọduru ala:

15O we chiri udọ̀ me utari, we chupu ha nile n'ulo uku Chineke, ma aturu ma ehi ahu; Ọ wusì ego ndi nāb͕anwe ego, kpù kwa table-ha iru;

16Ọ si ndi nēre nduru, Chipunu ihe ndi a n'ebe a; unu emela ulo Nnam ka ọ buru ulo ahia.

17Ndi nēso uzọ-Ya chetara na edere ya-ri n'akwukwọ nsọ, si, Ekworo ulo-Gi gēripiam.

18Ya mere ndi-Ju zara, si Ya, Ọ̀ bu ihe-iriba-ama gini ka I nēgosi ayi, ebe I nēme ihe ndia?

19Jisus zara, si ha, Kwatuenu ulo nsọ a, n'ubọchi atọ M'gēweli kwa ya elu.

20Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ?

21Ma Ya onwe-ya nēkwu okwu bayere ulo nsọ nke bu aru-Ya.

22Ya mere mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ndi nēso uzọ-Ya chetara na O kwuru okwu a; ha we kwere ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ya na okwu Jisus kwuru.

23Ma mb͕e Ọ nọ na Jerusalem n'ememe ngabiga, n'ememe ahu, ọtutu madu kwere n'aha-Ya, n'ihi na ha nāhu ihe-iriba-ama-Ya nile nke Ọ nēme.

24Ma Jisus onwe-ya araraghi Onwe-ya nye n'aka-ha na ntukwasi-obi, n'ihi na Ọ mara madu nile,

25ya na n'ihi na ọ dighi Ya nkpà ka onye ọ bula b͕ara madu àmà; n'ihi na Ya onwe-ya mara ihe di nime madu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help