ABÙ ỌMA 41 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-sisi Abù. Abù Ọma Devid.

1Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike:

N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.

2Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa;

Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya.

3Jehova gākwagide ya n'elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike:

Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n'ọria ya.

4Mu onwem siri, Jehova, merem amara:

Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi.

5Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si.

Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì?

6Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu;

Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe:

Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya.

7Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem:

N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ.

8Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru:

E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ.

9Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim,

Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.

10Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie,

Ka m'we kwughachi ha ugwọ.

11Nka ka m'ji mara na ihem nātọ Gi utọ,

N'ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n'arum.

12Ma mu onwem, n'izu-okèm ka I jideworom,

We me ka m'guzosie ike n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

13Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu,

Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

Amen, na Amen.

AKWUKWỌ NKE-ABUA
Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help