ỌPUPU 15 - Bible Lgbo

1Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si,

Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku:

Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

2Ikem na abù ọmam ka Ja bu,

Ọ we ghọrọm nzọputa:

Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu;

Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu.

3Jehova bu onye-agha:

Jehova bu aha-Ya.

4Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri:

Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie.

5Ob͕u-miri nēkpuchi ha:

Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume.

6Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike,

Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.

7N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi:

I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka.

8Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo,

Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo;

Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri.

9Onye-iro siri,

M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara:

Nkpuru-obim gējuputa na ha,

M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.

10I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha:

Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.

11Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova?

Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ?

Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.

12I setiri aka-nri-Gi,

Ala elo ha.

13N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:

N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.

14Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:

Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.

15Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:

Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:

Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.

16Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha;

N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume;

Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova,

Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.

17I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi,

Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova,

Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.

18Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

19N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri.

20Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.

21Miriam we za ha, si,

Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku;

Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

22Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri.

23Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara.

24Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu?

25Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha;

26si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.

27Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'akuku miri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help