ABÙ ỌMA 58 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam.

1Ọ̀ bu ezie na ezi omume nke kwesiri ka unu kwue bu ob͕i?

Ùnu ji izi-ezi kpe ikpe, unu umu madu?

2É-è, kama ọ bu nime obi ka unu nēme ajọ omume nile;

Unu nātùzi ihe-ike nke aka-unu n'uwa.

3Emewo ka ndi nēmebi iwu buru ndi ala ọzọ site n'àkpà-nwa:

Ha akpafuwo site n'afọ nne-ha, nēkwu okwu-ugha.

4Edide ha nwere yiri edide agwọ:

Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya;

5Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ,

Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe.

6Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha:

Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.

7Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya:

Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.

8Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze,

Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu.

9Tutu ite-unu amata ọku ogwu,

Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.

10Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu:

Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu.

11Madu gāsi kwa, N'ezie nkpuru diri onye ezi omume:

N'ezie Chineke di Nke nēkpe ikpe n'uwa.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help